A Hụla Ihe E Dere n’Otu Akwụkwọ Mpịakọta Ochie
E nweghị ike ịgụ ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ gbara ọkụ a hụrụ kemgbe afọ 1970 n’En-gidaị. Ma, ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ e ji nyochaa akwụkwọ ahụ mere ka a mata na ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ bụ ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Levitikọs. E dekwara aha Chineke na ya
N’AFỌ 1970, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwupụtara otu akwụkwọ mpịakọta gbara ọkụ n’En-gidaị dị n’Izrel. Obodo a dị nso n’ebe ọdịda anyanwụ ikpere mmiri Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ (Oké Osimiri Nnu). Ha gwutara ya mgbe ha na-egwukasị ebe e nwere otu ụlọ nzukọ a gbara ọkụ mgbe e bibiri obodo ahụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga. Otú akwụkwọ mpịakọta a dị mere ka o sie ike ịgụ ihe dị na ya, e nwedịghị ike ịmeghe ya emeghe n’ihi na ọ ga-agbarisi. Ma, ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ e ji ahụ ihe e dere ede mere ka e nwee ike ịhụ ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ihe meziri ka e nwee ike ịgụ ihe dị na ya bụ ihe ọhụrụ na-adị na kọmputa nke na-eme ka a hụ ihe nke ọma.
Gịnị ka ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ahụ mere ka a chọpụta? Ọ bụ na ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ bụ amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl. Ihe fọrọ n’akwụkwọ mpịakọta ahụ bụ amaokwu ụfọdụ dị ná mbido akwụkwọ Levitikọs. E dere mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nọchiri anya aha Chineke n’amaokwu ndị ahụ. Ọ dị ka è dere akwụkwọ mpịakọta ahụ n’agbata afọ 50 na afọ 400. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ọ bụ akwụkwọ mpịakọta Hibru kacha mee ochie a chọpụtarala kemgbe a chọpụtachara Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Otu nwoke aha ya bụ Gil Zohar kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Jerusalem Post, sị: “Tupu anyị enwee ike ịgụ ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta a hụrụ n’En-gidaị, e nwere akwụkwọ mpịakọta kacha mee ochie a na-akpọ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. E dere ya puku afọ abụọ gara aga. Ọ nọrọ otu puku afọ tupu e dee akwụkwọ mpịakọta ochie ọzọ a na-akpọ Alekpo Kodeks.” Ndị ọkachamara kwuru na ihe ndị a hụrụ n’akwụkwọ mpịakọta a gosiri na “o nweghị ihe a gbanwere n’akwụkwọ ise mbụ nke Baịbụl nke ndị Masoret depụtaghachiri, nakwa na ihe ndị depụtaghachiri ya dejọrọ agbanweghị ihe dị na ya.”