Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe I Nwere Ike Isi Nweta Ndụmọdụ Ga-abara Gị Uru n’Oge A?

Olee Ebe I Nwere Ike Isi Nweta Ndụmọdụ Ga-abara Gị Uru n’Oge A?

N’ụwa anyị a na-agbanwe n’ike n’ike, olee otú ị ga-esi jide n’aka na mkpebi ndị ị na-eme ga-eme ka ihe gaziere gị? Olee otú ị ga-esi jide n’aka na ihe e weere ka ihe ọma taa agaghị emecha bụrụ ihe ọjọọ echi?

Baịbụl ga-enyeliri gị aka ịna-eme mkpebi ndị ị na-agaghị emecha kwaara mmakwaara. Gịnị mere Baịbụl ga-eji enwe ike ime ya? Ọ bụ Onye kere anyị nyere anyị Baịbụl, ọ makwa ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ, obi eruokwa anyị ala.

“Jehova agwala gị ihe dị mma.”​—Maịka 6:8.

Anyị ga-atụkwasịli ezigbo amamihe dị na Baịbụl obi. ‘A ga-atụkwasịli ya obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.’​—Abụ Ọma 111:8.

Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka i jiri aka gị chọpụta otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka n’ụwa a na-agbanwe n’ike n’ike?