Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’ihe anyị chere na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

Otú Ọtụtụ Ndị Si Ekpebi Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Otú Ọtụtụ Ndị Si Ekpebi Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mmadụ niile kwetara na e nwere àgwà ndị dị mma, nweekwa àgwà ndị na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, n’ebe niile n’ụwa, a na-akatọ igbu mmadụ, idina mmadụ n’ike, na imetọ ụmụaka, na-etokwa àgwà ndị dị ka ikpe ikpe ziri ezi, ịdị obiọma, na inwe ọmịiko. Ma a bịa n’okwu gbasara inwe mmekọahụ, ịkwụwa aka ọtọ, ma ọ bụ otú e si azụ ụmụ, ọtụtụ ndị chere na onye ọ bụla nwere ike ikpebi ime ihe dị ya mma, na o nwechaghị ihe dị njọ na nke ọ bụla mmadụ mere. Ihe ọtụtụ ndị na-agbakwasị ụkwụ na ya ekpebi ihe ha ga-eme bụ ihe ha chere na ihe ndị ha na ha nọ chere. Ma, ihe a ọ̀ bụ otú dị mma mmadụ ga-esi na-ekpebi ihe ọ ga-eme?

IHE ANYỊ CHERE

Anyị na-agbakwasịkarị ụkwụ n’ihe anyị chere ma ọ bụ n’ihe akọnuche anyị gwara anyị na ọ dị mma ma ọ bụ na ọ dị njọ ekpebi ihe anyị chọrọ ime. (Ndị Rom 2:14, 15) Ụmụaka na-amadị ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Obi ha na-amakwa ha ikpe ma ha mee ihe na-adịghị mma. Ka oge na-aga, ihe na-ekpebi otú akọnuche anyị ga-esi na-arụ ọrụ bụ ihe ndị anyị mụtara n’aka ndị ezinụlọ anyị, ndị ọgbọ anyị, ndị obodo anyị, ndị okpukpe anyị, nakwa n’omenala obodo anyị. Anyị mewe mkpebi, akọnuche anyị na-agwa anyị ma mkpebi ahụ ọ̀ dabara n’ihe anyị chere bụ́ ihe dị mma ka ọ̀ bụ na ọ dabaghị.

Ihe anyị weere ka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ nwere ike ime ka anyị nweere mmadụ ọmịiko, kelee onye meere anyị ihe ọma, kpee ikpe ziri ezi, metakwara ndị ọzọ ebere. O nwekwara ike ime ka anyị ghara ime ihe ga-ewute ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ ime ihe ga-emechu anyị ihu ma mee ka obi anyị mawa anyị ikpe.

Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’ihe anyị chere na-ekpebi ihe anyị ga-eme? E nwere otu nwoke aha ya bụ Garrick. Mgbe ọ bụ okorobịa, ọ sịrị: “Ihe ọ bụla masịrị m ka m ga na-eme.” Ma, o mechara chọpụta na ime ihe ndị o chere na ha dị mma kpataara ya nsogbu. O kwuru na ‘ụdị ndụ o biri mgbe ahụ emetụdịghị ya obi ụtọ n’ihi na ihe e ji mara ya bụ ime omume rụrụ arụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, aṅụrụma, na tigbuo zọgbuo.’

IHE NDỊ ỌZỌ CHERE

E wezụga ihe anyịnwa chere, ọ bụ ihe ndị ọzọ chere ka anyị na-agbakwasịkarị ụkwụ ekpebi ihe anyị ga-eme. Ihe a nwere ike ime ka ihe ndị ha ma na ihe ndị merela ha baara anyịnwa uru. Ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, na ndị obodo anyị na-akwanyekwara anyị ùgwù ma anyị mee ihe ha chere bụ́ ihe dị mma.

Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ndị ọzọ chere na-ekpebi ihe anyị ga-eme? Mgbe otu nwaanyị aha ya bụ Priscila bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di, ọ nọ na-eme ihe ndị ọgbọ ya chere bụ́ ihe dị mma, na-aṅụ ịkwa iko ka mmiri. Ma, o mechara chọpụta na ime ihe ndị ọzọ chere na ọ dị mma emeghị ka ọ na-enwe obi ụtọ. O kwuru, sị: “Iso ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme emeghị ka m na-enwe obi ụtọ. Kama, o mere ka m mee ihe ndị jọgburu onwe ha.”

OTÚ KACHA MMA ANYỊ GA-ESI NA-EME MKPEBI

Anyị chọwa ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ihe anyị chere na ihe ndị ọzọ chere nwere ike inyere anyị ezigbo aka. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-eme ka anyị mee mkpebi dị mma. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ime mkpebi ga-akpatara anyịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ nsogbu n’ihi na anyị amaghị na ọ ga-akpata nsogbu ahụ. (Ilu 14:12) Anyị ejighịkwa n’aka na ihe anyị chere ma ọ bụ ihe ndị ọzọ chere ga-enyeliri anyị aka ime mkpebi dị mma. Mmadụ nwekwara ike ịgbanwe echiche ya echi. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị anabatala ụfọdụ àgwà e weere na ha adịghị mma n’oge ndị gara aga. Ụfọdụ àgwà ndị nke e weere na ha dị mma n’oge gara aga adịghịzi ndị mmadụ mma ugbu a.

Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ndị ọzọ chere na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

È nwere ihe ka mma ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ? È nwere ebe anyị ga-esi na-enweta ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma ma ugbu a ma n’ọdịnihu?

Obi dị anyị ụtọ na e nwere ebe onye ọ bụla nọ n’ebe ọ bụla n’ụwa nwere ike isi nweta ezigbo ndụmọdụ ga-enyere ya aka ịna-akpa àgwà ọma. Isiokwu na-eso nke a ga-ekwu ebe anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ kacha mma ga-enyere anyị aka ikpebi ma ihe anyị chọrọ ime ọ̀ dị mma ka ọ̀ bụ na ọ dịghị mma.