Mgbe Nsogbu Mere Ka Ọ Dị Gị Ka Gị Nwụọ
Ò NWETỤLA mgbe obi nọ na-ajọ gị ezigbo njọ nke na ọ dị gị ka ọnwụ bịa gbuo gị? Ọ bụrụ na o nweela, ị ga-aghọta otú obi dị Adriana.
E nwekwara otu nwoke onye Japan aha ya bụ Kaoru. Ọ na-elekọta nne na nna ya merela agadi ma na-arịa ọrịa. Ọ sịrị: “N’oge ahụ m na-elekọta ha, nsogbu zuru m ahụ́ n’ụlọ ọrụ anyị. Ka oge na-aga, agụụ anaghịzi agụ m, ihi ụra ana-esikwara m ike. M maliteziri iche na nsogbu a niile ga-ebikwanụ ma ọ bụrụ nnọọ na mụ anwụọ.”
Otu nwoke onye Naịjirịa aha ya bụ Ojebode kwuru, sị: “Obi na-ajọkarị m njọ nke na m na-anọkata bewe ákwá. N’ihi ya, m chọwara otú m m ga-esi gbuo onwe m.” Obi dị anyị ụtọ na Ojebode, Kaoru, na Adriana emechaghị gbuo onwe ha. Ma, n’afọ ọ bụla, ọtụtụ narị puku mmadụ na-egbu onwe ha.
EBE ANYỊ GA-ENWETA ENYEMAKA
Ọtụtụ n’ime ndị na-eji aka ha egbu onwe ha na-abụkarị ụmụ nwoke. Ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji gbuo onwe ha bụ na ihere ekweghị ha rịọ ka e nyere ha aka. Ma, Jizọs sịrị na mkpa ọgwọ ọrịa dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. (Luk 5:31) Ọ bụrụ na obi na-ajọkarị gị njọ nke na ị na-eche banyere igbu onwe gị, biko ihere emela gị ikwu ka e nyere gị aka. Ọtụtụ ndị ụdị ihe a na-eme achọpụtala na ịga ụlọ ọgwụ enyerela ha aka inwetatụ onwe ha ma na-edi ya. Ma Ojebode ma Kaoru ma Adriana gachara ụlọ ọgwụ, e nyere ha aka. Ugbu a, ha enwetatụla onwe ha.
Ndị dọkịta nwere ike inye onye ahụ ọgwụ ma ọ bụ ha na ya ana-ekwurịta okwu ma ọ bụkwanụ ha emee ha abụọ iji nyere ya aka. Ọ na-adịkwa mma ka ndị ezinụlọ na ndị enyi onye ụdị ihe a na-eme na-aghọta ha, na-enwere ha ndidi, na-elekọta ha ma na-enyere ha aka. Enyi kacha enyi onye ọ bụla nwere ike inwe bụ Jehova Chineke. Ọ na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl enyere ndị mmadụ ezigbo aka.
È NWERE IHE GA-EME KA NSOGBU A KWỤSỊ KPAMKPAM?
O nwere ike ịdị mkpa ka a na-agwọ ndị obi na-ajọkarị njọ ma ọ bụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ ruo ogologo oge. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ha gbanwee otú ha si eme ihe ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na i nwere ụdị nsogbu a, nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, otú ahụ Ojebode nwere. O kwuru, sị: “M na-atụ anya mgbe ihe e kwuru n’Aịzaya 33:24 ga-emezu. Ebe ahụ kwuru na oge na-abịa mgbe a na-enweghị onye bi n’ụwa ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ ” Chineke kwekwara nkwa na a ga-enwe “ụwa ọhụrụ” nke “ihe mgbu” na-agaghịzi adị na ya. Ka nkwa a mee ka obi sie gị ike ka Ojebode. (Mkpughe 21:1, 4) Ihe ọ pụtara bụ na ihe niile na-enye mmadụ nsogbu n’obi ga-ala ka naị. O nweghịzi mgbe obi ga na-ajọ gị njọ. Ị gaghịzi “echeta [ihe niile na-echegbu gị], ha agaghị abatakwa [gị] n’obi.”—Aịzaya 65:17.