Ngọzi Ndị Na-erubere Chineke Isi Ga-enweta
Mozis onye amụma kwuru na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị na-erubere iwu ya isi. (Diuterọnọmi 10:13; 11:27) Ihe mere anyị ji na-erubere Chineke isi abụghị ka ọ ghara ịta anyị ahụhụ. Àgwà Chineke ndị magburu onwe ha na-eme ka anyị na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa izere ime ihe nwere ike ikpasu ya iwe. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.
Ma olee otú ịna-erubere Chineke isi ga-esi eme ka ọ gọzie anyị? Ka anyị tụlee ụzọ abụọ.
1. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ MARA IHE
“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, . . . na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.”—AỊZAYA 48:17.
Jehova Chineke, Onye kere anyị, maara anyị nke ọma ma na-enye anyị nduzi dị anyị mkpa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe ndị ọ na-akụziri anyị na-enyere anyị aka ịna-eme ezigbo mkpebi, anyị ga-amụta ihe ndị Chineke chọrọ ka anyị na-eme n’Akwụkwọ Nsọ ma na-eme ha eme.
2. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ
“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.”—LUK 11:28.
Taa, ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eme ihe Okwu Chineke kwuru na-enwe ezigbo obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, tụlee gbasara otu nwoke bi na Spen. Nwoke a na-ewe iwe ọkụ ma na-emesi nwunye ya na ndị ọzọ ike. Otu ụbọchị, ọ gụrụ ihe Mozis onye amụma dere gbasara otú nwa Jekọb aha ya bụ Josef si dịrị nwayọọ n’obi. E rere Josef ka ọ gaa gbawa ohu. A tụkwara ya mkpọrọ na-enweghị ihe o mere. N’agbanyeghị ihe ndị a e mere Josef, ọ nọgidere na-adị nwayọọ n’obi, na-eme udo ma na-agbaghara ndị ọzọ ihe ndị ha mere ya. (Jenesis isi 37 ruo 45) Nwoke ahụ bi na Spen kwuru, sị: “Ichebara ihe Josef mere echiche nyeere m aka ịdị nwayọọ n’obi, ịdị obiọma ma na-ejide onwe m. Nke a emeela ka m na-enwe obi ụtọ ugbu a.”
Akwụkwọ Nsọ kụziiri anyị otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Gụọ gbasara ya n’isiokwu na-esonụ.