Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-agụkọ Ihe Ọ Ga-efu?

Ị̀ Na-agụkọ Ihe Ọ Ga-efu?

Ị̀ Na-agụkọ Ihe Ọ Ga-efu?

JIZỌS KRAỊST nyere ndị na-eso ụzọ ya olileanya nke ndụ ebighị ebi, ma ọ gbakwara ha ume ịgụkọ ihe ịbụ Onye Kraịst na-efu. O mere ka isi ihe ahụ doo anya site n’ịjụ, sị: “Ònye n’ime unu bụ́ onye chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-adịghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ [ma ọ bụ, gụkọọ] ihe ọ ga-efu, iji hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iwucha ya?” (Luk 14:28) Olee ihe ọ ga-efu nke Jizọs bu n’obi ka a gụkọọ?

Ndị Kraịst nile na-enweta ọnwụnwa—ụfọdụ na-esi ike. (Abụ Ọma 34:19; Matiu 10:36) Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịdị njikere n’uche na n’ụzọ ime mmụọ ka o wee ghara iju anyị anya mgbe anyị nwetawara mmegide ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. Ọ ghaghị ịbụworị na anyị agbakọnyewo ihe ịma aka ndị dị otú ahụ n’ihe ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst na-efu, na-amara na ụgwọ ọrụ ya—nzọpụta pụọ ná mmehie na ọnwụ—karịrị ihe ọ bụla anyị pụrụ inweta n’usoro ihe dị ugbu a. Ee, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kwere ka ọ dịrị—ọbụna ọnwụ—nke pụrụ imerụ anyị ahụ́ n’ụzọ na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ejere ya ozi.—2 Ndị Kọrint 4:16-18; Ndị Filipaị 3:8.

Olee otú okwukwe anyị pụrụ isi sie ike otú ahụ? Okwukwe anyị na-esikwu ike mgbe ọ bụla anyị mere mkpebi ziri ezi, guzosie ike maka ụkpụrụ Ndị Kraịst, ma ọ bụ mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke—karịsịa mgbe a na-arụgide anyị ime ihe dị iche. Mgbe anyị onwe anyị nwetara ngọzi Jehova n’ihi ụzọ ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi anyị, a na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma mikwuo emie. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-agbaso ihe nlereanya Jizọs, nke ndị mbụ soro ụzọ ya, na nke ndị ikom na ndị inyom nile nwere okwukwe bụ́ ndị, n’ime ọgbọ nile, ‘gụkọrọ ihe ijere Chineke ozi na-efu,’ n’ụzọ ziri ezi.—Mak 1:16-20; Ndị Hibru 11:4, 7, 17, 24, 25, 32-38.