Nnukwu Onye Nchụàjà nke Mara Jizọs Ikpe Ọnwụ
Nnukwu Onye Nchụàjà nke Mara Jizọs Ikpe Ọnwụ
NA November 1990, ndị ọrụ na-arụ ọrụ n’otu ogige ntụrụndụ na n’okporo ụzọ dị ihe dị ka otu kilomita site n’ebe ndịda Obodo Ochie Jeruselem hụrụ otu ihe na-adọrọ mmasị. Na mberede, otu traktọ kpughepụrụ elu otu ọgba a na-eli ozu na ya n’oge ochie. Gburugburu ebe ahụ bụ nnukwu ebe a na-eli ozu site na narị afọ mbụ T.O.A. ruo na narị afọ mbụ O.A. Ihe ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie hụrụ n’ime ya na-akpali nnọọ mmasị.
E nwere igbe ọkpụkpụ 12 n’ọgba ahụ, bụ́ ebe a na-etinye ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị e buru ụzọ debe n’ili ruo otu afọ ka ahụ́ ha rekasịa. E dere aha bụ́ Yehosef bar Caiapha (Josef nwa Keifas) n’ahụ́ otu n’ime igbe ọkpụkpụ ndị ahụ bụ́ nke a chọrọ nnọọ mma. Igbe ọkpụkpụ a bụ otu n’ime ndị kasị mma a chọtarala.
Ihe àmà na-egosi na ili ahụ pụrụ ịbụ nke nnukwu onye nchụàjà kpere ikpe kasị mkpa e kpetụrụla—ikpe Jizọs Kraịst. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kpọrọ nnukwu onye nchụàjà a “Josef, bụ́ onye a na-akpọ Keifas.” A kpọrọ ya nanị Keifas n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ihe banyere ya? Gịnị kpaliri ya ịma Jizọs ikpe ọnwụ?
Ezinụlọ na Nzụlite Ya
Keifas lụrụ ada Anas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà ọzọ. (Jọn 18:13) O yiri ka è mere ndokwa alụmdi na nwunye mmadụ abụọ a ọtụtụ afọ tupu ha agbaa akwụkwọ, n’ihi na ezinụlọ abụọ a ga-achọ ijide n’aka na njikọ ahụ dabara nnọọ adaba. Nke a pụtara iji nlezianya nyochaa osuso ọmụmụ nke ezinụlọ abụọ a iji jide n’aka na ha si n’agbụrụ ndị nchụàjà n’ezie. O yiri ka ezinụlọ abụọ a hà bara ọgaranya ma bụrụ ndị a ma ama, ọ pụkwara ịbụ na akụ̀ na ụba ha nwere si n’ọtụtụ ala na ụlọ ha nwere na Jeruselem. O doro anya na Anas chọrọ ijide n’aka na onye gaje ịbụ ọgọ ya nwoke ga-abụ onye ọ tụkwasịrị obi ya na ya ga-agbakọ aka n’ọchịchị. O yiri ka ma Anas ma Keifas hà socha n’òtù ndị Sadusii a ma ama.—Ọrụ 5:17.
Dị ka onye a mụrụ n’ezinụlọ ndị nchụàjà a ma ama, Keifas ga-abụworị onye e ji Akwụkwọ Nsọ Hibru kụziere ihe ma kọwaara ya ihe ndị dị na ya. Ọ ga-abụworị na ọ malitere ije ozi n’ụlọ nsọ mgbe ọ dị afọ 20, ma ọ dịghị onye ma afọ ole ọ dị mgbe ọ ghọrọ nnukwu onye nchụàjà.
Nnukwu Ndị Nchụàjà na Ndị Isi Nchụàjà
Na mbụ, ọkwá nnukwu onye nchụàjà na-abụ ihe nketa na ihe a na-ejigide ruo ọnwụ. Ma, na narị afọ nke abụọ, T.O.A., ndị Hasmon weghaara ya n’ike. * Herọd onye ukwu ji aka ya họpụta ma wetuo nnukwu ndị nchụàjà, na-eme ka o doo anya na ọ bụ ya n’ezie na-etinye mmadụ n’ọkwá a. Ndị gọvanọ bụ́ ndị Rom mere ihe yiri nke ahụ.
Ihe ndị ahụ na-emenụ n’oge ahụ mere ka e guzobe òtù Akwụkwọ Nsọ kpọrọ “ndị isi nchụàjà.” (Matiu 26:3, 4) E wezụga Keifas, ndị ọzọ so n’òtù ahụ gụnyere ndị bụbu nnukwu ndị nchụàjà, dị ka Anas, bụ́ onye a chụturula n’ọkwá ahụ ma ya anọgide na-aza ya n’aha. Ndị ọzọ mejupụtakwara òtù a gụnyere ndị ezinụlọ nke nnukwu ndị nchụàjà n’oge ahụ na ndị ezinụlọ nke ndị bụbu ya.
Ndị Rom hapụrụ ndị oké ozu ndị Juu, gụnyere ndị isi nchụàjà, ka ha na-achịkwa ihe ndị a na-eme n’obodo Juda kwa ụbọchị. Nke a mere ka ọ dịrị ndị Rom mfe ịchịkwa ógbè ahụ na ịnakọta ụtụ isi ebe ahụ n’ezigaraghị ha ọtụtụ ndị agha. Ndị Rom tụrụ anya ka ndị ndú ndị Juu hụ na udo dị n’obodo ahụ ma chebe ihe ndị Rom nwere n’ebe ahụ. Ndị ọchịchị Rom ahụchaghị ndị ndú ndị Juu n’anya, bụ́ ndị na-enweghị mmasị n’ọchịchị ndị Rom na-achị ha. Ma, ọ ga-abara ma ndị Rom ma ndị Juu uru ma ọ bụrụ na ha arụkọọ ọrụ ọnụ iji hụ na e nwere ọchịchị kwụsiri ike.
Ka ọ na-erule n’oge Keifas, nnukwu onye nchụàjà bụzi onye ọchịchị nke ndị Juu. Ọ bụ Kwiriniọs, bụ́ gọvanọ Rom chịrị Siria, tinyere Anas n’ọkwá a n’afọ 6 ma ọ bụ 7 O.A. Akụkọ ọdịnala ndị Rabaị na-egosi na e ji anyaukwu, imelara ndị ikwu ihe, mmegbu, na ime ihe ike mara ezinụlọ ndị oké ozu na-achị ndị Juu. Otu onye edemede na-eche na Anas dị ka nnukwu onye nchụàjà ga-ahụ na ‘e buliri ọgọ ya nwoke n’ọkwá ngwa ngwa n’ụlọ nsọ ahụ; e kwuwerị, ka Keifas na-arịkwu n’ọkwá, otú ahụ ka ọ ga na-abakwuru Anas uru.’
Valerius Gratus, bụ́ gọvanọ nke obodo Juda, chụturu Anas n’ọkwá, n’ihe dị ka afọ 15 O.A. Mmadụ atọ ndị ọzọ, gụnyere otu n’ime ụmụ Anas ghọrọ nnukwu ndị nchụàjà ma ha anọteghị aka na ya. Keifas ghọrọ nnukwu onye nchụàjà n’ihe dị ka afọ 18 O.A. Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye ghọrọ gọvanọ nke obodo Juda n’afọ 26 O.A., hapụrụ Keifas n’ọkwá ahụ ruo afọ iri ọ bụrụ gọvanọ. Ọ bụ Keifas bụ nnukwu onye nchụàjà n’oge ije ozi Jizọs, nakwa ná mmalite nke oge ndị na-eso ụzọ ya mere nkwusa. Ma, Keifas achọghị iji ntị anụ ozi Ndị Kraịst na-ezi.
Ọ Na-atụ Jizọs Ụjọ, Na-atụkwa Ndị Rom
Keifas lere Jizọs anya dị ka onye na-akpasu ọgba aghara nke pụrụ imebiri ya ihe. Jizọs kwuru na otú ndị ndú ndị Juu si kọwaa iwu Ụbọchị Izu Ike ezighị ezi, ọ chụpụkwara ndị na-ere ihe na ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ, kwuo na ha emewo ụlọ nsọ ahụ “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Luk 19:45, 46) Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kweere na ọ bụ ezinụlọ Anas nwe ahịa ahụ a na-azụ n’ụlọ nsọ ahụ—nke nwere ike ịbụ ihe ọzọ mere Keifas ji gbalisie ike ịhụ na e gburu Jizọs. Mgbe ndị isi nchụàjà zigara ndị ọrụ nche ka ha gaa jide Jizọs, ihe ndị ọrụ nche a nụrụ n’ọnụ ya nwụrụ ha nnọọ ibobo n’ahụ́, nke na ha gba aka lọghachi.—Jọn 2:13-17; 5:1-16; 7:14-49.
Tụlee ihe merenụ mgbe ndị ndú ndị Juu nụrụ na Jizọs akpọlitela Lazarọs n’ọnwụ. Oziọma Jọn kọrọ, sị: “Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii mere ka Sanhedrin zukọta wee malite ịsị: ‘Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ Jọn 11:47, 48) Òtù Sanhedrin lere Jizọs anya dị ka onye na-achọ imebiri òtù okpukpe ahụ ihe na onye na-achọ ịkpata ọgba aghara n’obodo, bụ́ nke ha ga-aza Paịlet ajụjụ maka ya ma o mee emee. Òtù ọ bụla a ma ama nke ndị Rom pụrụ iwere dị ka nke ga-agba ọchịchị ha mgba okpuru pụrụ ịkpali ndị Rom itinyewe anya n’ihe metụtara ndị Juu—bụ́kwanụ ihe ndị Sanhedrin chọrọ izere n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe.
ihe ịrịba ama? Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha nile ga-etinye okwukwe na ya, ndị Rom ga-abịakwa weghara ma ebe anyị ma mba anyị.’” (Ọ bụ ezie na Keifas enweghị ike ikwu na Jizọs arụghị ọrụ ebube, o gosipụtaghị okwukwe na Jizọs, kama ọ chọrọ ụzọ ọ ga-esi nọgide n’ọkwá na n’ọchịchị ya. Olee otú ọ ga-esi kweta na a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ? Dị ka onye Sadusii, Keifas ekweghị ná mbilite n’ọnwụ!—Ọrụ 23:8.
Obi ọjọọ Keifas pụtara ìhè mgbe ọ gwara ndị ndú ibe ya, sị: “Unu echeghịkwa echiche na ọ bụ maka ọdịmma unu ka otu onye nwụchitere mmadụ nile ọnwụ, kama a ga-ebibi mba a dum.” Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Otú ọ dị, o kwughị nke a n’echiche nke onwe ya; kama n’ihi na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ, o buru amụma na a kara aka na Jizọs ga-anwụ maka mba ahụ, ọ bụghịkwa nanị maka mba ahụ, kama ka o wee chịkọtakwa ụmụ Chineke a chụsasịrị achụsasị n’otu. Ya mere, malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ha gbara izu igbu [Jizọs].”—Jọn 11:49-53.
Keifas amaghị ihe nile okwu ya pụtara. N’ihi na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà, o buru amụma. * Ọnwụ Jizọs ga-aba uru—ma ọ bụghị nanị ndị Juu ka ọ ga-abara uru. Àjà mgbapụta ya ga-abụ ihe a ga-eji gbapụta ihe nile a kpọrọ mmadụ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ.
Izu Igbu Ọchụ
Ndị isi nchụàjà ndị Juu na ndị okenye zukọtara n’ụlọ Keifas iji kwurịta otú ha ga-esi jide Jizọs ma gbuo ya. O yiri ka nnukwu onye nchụàjà ò so ná ndị ha na Judas Iskarịọt kpebiri ego ole a ga-eji rara Jizọs nye. (Matiu 26:3, 4, 14, 15) Otú ọ dị, igbu otu onye ezurughị Keifas imezu nzube ọjọọ ya. “Ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbukwa Lazarọs, n’ihi na ọ bụ maka ya ka ọtụtụ n’ime ndị Juu ji . . . na-etinye okwukwe na Jizọs.”—Jọn 12:10, 11.
Malkọs, bụ́ ohu Keifas, so ná ndị e zigara ịga jide Jizọs. Mgbe ha jidesịrị Jizọs, ha buru ụzọ duru ya gaa na nke Anas ka ọ gbaa ya ajụjụ, mesịzie duru ya gaa na nke Keifas, bụ́ onye kpọkọtaralarị ndị okenye ndị Juu maka ikpe Jizọs ikpe abalị, bụ́ nke megidere iwu.—Matiu 26:57; Jọn 18:10, 13, 19-24.
Keifas alaghị azụ n’ikpe Jizọs ikpe mgbe olu ndị gbara akaebe ụgha megide Jizọs gbara iche iche. Nnukwu onye nchụàjà ahụ maara otú ndị ya na ha so na-agba izu ọjọọ ga-esi lee onye ọ bụla nwara anwa kpọọ onwe ya Mezaịa anya. N’ihi ya, ọ jụrụ Jizọs ma ọ̀ na-akpọ onwe ya Mezaịa. Jizọs sịrị na ndị ahụ na-ebo ya ebubo ga-ahụ ka ya “na-anọdụ ala n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.” Iji mee ka ndị mmadụ chee na o ji okpukpe kpọrọ ihe, “nnukwu onye nchụàjà ahụ dọwara uwe elu ya, na-asị: ‘O kwuwo okwu nkwulu! Olee mkpa ọzọ anyị nwere maka ndị akaebe?’” Ndị òtù Sanhedrin kwekọrịtara na Jizọs kwesịrị ọnwụ.—Matiu 26:64-66.
A ga-enwetarịrị nkwado nke ndị Rom tupu e gbuo mmadụ. O yiri ka ọ̀ bụ Keifas wegaara Paịlet okwu ahụ ebe ọ bụ onye nọ n’etiti ndị Rom na ndị Juu. Mgbe Paịlet chọrọ ịtọhapụ Jizọs, ọ pụrụ ịbụ na Keifas so ná ndị isi nchụàjà tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!” (Jọn 19:4-6) Ikekwe Keifas gbara ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ ume ka ha tie mkpu ka a tọhapụrụ ha otu ogbu mmadụ kama ịtọhapụ Jizọs, ọ pụkwara ịbụ na o so ná ndị isi nchụàjà ahụ ji ihu abụọ kwuo, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.”—Jọn 19:15; Mak 15:7-11.
Keifas jụrụ ihe àmà nke mbilite n’ọnwụ Jizọs. O megidere Pita na Jọn, megidekwa Stivin. Keifas nyekwara Sọl ikike ịnwụchi Onye Kraịst ọ bụla ọ hụrụ na Damaskọs. (Matiu 28:11-13; Ọrụ 4:1-17; 6:8–7:60; 9:1, 2) Otú ọ dị, Vitellius, bụ́ onye Rom chịrị Siria, wepụrụ Keifas n’ọkwá nnukwu onye nchụàjà n’ihe dị ka afọ 36 O.A.
Ihe odide ndị Juu ekwughị okwu ọma banyere ezinụlọ Keifas. Dị ka ihe atụ, Talmud nke Babilọn kwara arịrị, sị: “Ahụhụ dịịrị m n’ihi ezinụlọ Hanin [Anas], ahụhụ dịịrị m n’ihi okwu nzuzo,” ma ọ bụ “ebubo ụgha ha.” A na-eche na ihe kpatara okwu mwute a bụ “nnọkọ nzuzo ndị e nwere iji chepụta ihe a ga-eji mekpọọ ndị mmadụ ọnụ.”
Ihe Ndụ Keifas Na-akụziri Anyị
Otu ọkà mmụta kọwara nnukwu ndị nchụàjà dị ka “ndị na-akpọ ekwe nkụ, ndị maara ihe na ndị ma nke a na-akọ—o yikwara nnọọ ka hà bụ ndị mpako.” Mpako gbochiri Keifas ịnabata Mezaịa ahụ. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi Bible taa. Ụfọdụ enweghị mmasị zuru ezu n’eziokwu Akwụkwọ Nsọ nke ga-eme ka ha hapụ nkwenkwe ndị ha ji kpọrọ ihe. Ndị ọzọ pụrụ iche na ịghọ ndị nkwusa ozi ọma dị umeala n’obi ga-ewetu ha ala. Ndị anyaukwu na ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-agbakwara ụkpụrụ Ndị Kraịst ọsọ.
Keifas, dị ka nnukwu onye nchụàjà, gaara enwe ike inyere ndị Juu ibe ya aka ịnabata Mezaịa ahụ, ma ọchịchọ o nwere inweta ikike dugara ya n’ịma Jizọs ikpe ọnwụ. O yiri ka Keifas ọ̀ nọgidere na-emegide ndị Chineke ruo mgbe ọ nwụrụ. Ihe e dekọrọ banyere àgwà ya na-egosi na ọkpụkpụ abụghị nanị ihe a ga-eji na-echeta anyị mgbe anyị nwụrụ. Site n’àgwà anyị, anyị na-emere onwe anyị aha na-adịgide adịgide n’ebe Chineke nọ, ma ọ́ bụghị nke ọma ya abụrụ nke ọjọọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Maka akụkọ ndị Hasmon, biko lee Ụlọ Nche nke June 15, 2001, peeji nke 27-30.
^ par. 19 Tupu mgbe ahụ, Jehova mere ka Belam bụ́ onye ajọ omume buo ezi amụma banyere ndị Izrel.—Ọnụ Ọgụgụ 23:1-24:24.
[Foto dị na peeji nke 10]
Josef nwa Keifas
[Foto dị na peeji nke 10]
Igbe ọkpụkpụ a chọtara n’oge na-adịbeghị anya
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 10]
Igbe ọkpụkpụ, ihe odide, na ọgba dị n’azụ: Site n’ikike a natara Ndị Na-ahụ Maka Ihe Ochie n’Izrel