Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Samuel Kwalitere Ezi Ofufe

Samuel Kwalitere Ezi Ofufe

Samuel Kwalitere Ezi Ofufe

OTU onye amụma baara ndị obodo ya rịọrọ ka e nye ha eze bụ́ mmadụ mba, ọ gbakwara ha ume irubere Chineke isi. Iji gosi na ya bụ ezi onye amụma Chineke, ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka e nwee égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo. Oge a n’afọ abụghị oge mmiri n’Izrel, kama ọ bụ oge owuwe ihe ubi ọka wit. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke mere ka e nwee égbè eluigwe na mmiri ozuzo. N’ihi ya, ndị Izrel tụrụ nnọọ egwu Jehova na onye nnọchianya ya, bụ́ Samuel.—1 Samuel 12:11-19.

Samuel onye amụma bụkwa onye edemede. Akụkọ ihe mere eme o dere nke kọrọ banyere ọtụtụ ihe ndị dị ịrịba ama kwuru banyere ihe ndị mere n’agbata ihe dị ka narị afọ atọ na iri atọ, o kwukwara banyere ike Ndị Ikpe Izrel kpara. Dị ka ihe atụ, e jirila akụkọ ndụ Samsin, bụ́ nwoke kasị ike nke dịtụrụla ndụ, dee abụ, gụọ egwu, jirikwa ya mee ihe nkiri ndị a na-egosi na televishọn na ndị a na-eme n’ọgbọ egwuregwu. (Ndị Ikpe, isi 13–16) Samuel dekwara akụkọ banyere Rut na nne di ya, bụ́ Naomi, ndị bụ́cha ogbenye na ndị inyom di ha nwụrụ. Akụkọ a mere eme nke ọgwụgwụ ya dị mma tọkwara ụtọ ka nke Samsin.—Rut, isi 1–4.

Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị Samuel dere na ndụ ya? Oleekwa otú o si kwalite ezi ofufe?

Mgbe Ọ Bụ Nwata

Nna Samuel bụ́ Elkana bụ onye na-efe Jehova na di na-ahụ n’anya. Nwunye Elkana, bụ́ Hana, bụ nwanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. N’ụlọ Jehova dị na Shaịlo, Hana bụ́ nwanyị aga kpesiri ekpere ike nye Chineke ma kwe ya nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha, ọ bụrụ na I lekwasị anya n’ezie ná mweda n’ala nke ohu Gị nwanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwanyị, wee nye ohu Gị nwanyị nwa nwoke, m ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.” (1 Samuel 1:1-11) Nke a pụtara na nwa ahụ ga-eji ụbọchị ndụ ya nile jeere Jehova ozi.

Hana kpere ekpere ahụ n’obi ya. Akụkọ ahụ kwuru na “nanị egbugbere ọnụ ya na-eme ụkpọrọ.” Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị chere na ọ ṅụbigara mmanya ókè ma baara ya mba. Otú ọ dị, Hana ji nwayọọ kọwaara ya nsogbu ya, Ilaị gwakwara ya, sị: “Laa n’udo: Chineke Izrel nyekwa gị arịrịọ gị nke ị rịọworo n’aka Ya.” Jehova zara Hana ekpere ya, n’ihi na akụkọ ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “O ruo, n’ọgbụgba afọ, na Hana tụụrụ ime, mụọ nwa nwoke; o wee kpọọ aha ya Samuel, sị, N’ihi na ọ bụ n’aka Jehova ka m rịọworo ya.”—1 Samuel 1:12-20.

A zụlitere Samuel “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Ngwa ngwa a napụrụ Samuel ara, Hana kpọtara ya n’ụlọ Chineke dị na Shaịlo ma kpọnye ya Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị. Nwata ahụ wee “na-ejere Jehova ozi” n’ihu Ilaị. Okwu ndị na-akpali akpali Hana ji kelee Chineke, bụ́ ndị Samuel n’onwe ya mesịrị dekọọ, gosiri oké ọṅụ Hana nwere.—1 Samuel 2:1-11.

Ya bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-agba ụmụ gị ume iji ozi Jehova mere aka ọrụ? Ihe kasị mma mmadụ pụrụ iji ike ya mee bụ ịkwalite ezi ofufe.

Samuel mere nnọọ ka ndụ a na-ebi n’ebe ịchụàjà maa ya ahụ́. O wee “na-eto n’ụlọ Jehova” ma “dị mma, ma n’ebe Jehova nọ, ma n’ebe mmadụ nọ.” Nṅomi o ṅomiri Chineke mere ka ndị ọzọ hụ ya n’anya.—1 Samuel 2:21, 26.

Ụmụ ndị ikom Ilaị àgwà ha jọgburu onwe ha bụ́ Họfnaị na Finihas, bụ́ ndị ‘na-amaghị Jehova,’ adịghị otú ahụ. Ha na-akwa iko ma na-eji aka ha ewere akụkụ kasị mma n’ihe ndị mmadụ wetara iji chụọ àjà n’ebe nsọ. Chineke ebuworị ụzọ ziga onye amụma ka ọ gaa gwa Ilaị ihe ọjọọ nwere ike ime ya, nke gụnyere ọnwụ nke ụmụ ya abụọ. (1 Samuel 2:12, 15-17, 22-25, 27, 30-34) Jehova ga-eziga Samuel ịga zie ya ozi amamikpe ọzọ.

Otú Samuel Si Malite Ije Ozi Dị Ka Onye Amụma

Chineke gwara Samuel, sị: “Egosiwokwa m [Ilaị] na Mụ onwe m na-ekpe ụlọ ya ikpe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi ajọ omume nke ọ maara, n’ihi na ụmụ ya ndị ikom na-ewetara onwe ha nkọcha, ma o gbochighị ha.” Ozi a adịghị mfe ozizi, Ilaị sikwara ọnwụ na Samuel agaghị ezoro ya ihe ọ bụla. N’ihi ya, Samuel gwara ya ihe nile Jehova kwuru. Nke ahụ chọrọ obi ike!—1 Samuel 3:10-18.

Ka Samuel toro, ndị Izrel nile bịara mara na ọ bụ onye amụma Chineke. (1 Samuel 3:19, 20) Ikpe ọmụma ahụ Samuel buru n’amụma malitere mezuwe mgbe ndị Filistia meriri Izrel ajọ mmeri. Họfnaị na Finihas nwụrụ n’agha ahụ, ndị Filistia bukwaara igbe ọgbụgba ndụ Jehova. Mgbe Ilaị nụrụ na ụmụ ya abụọ anwụọla, nakwa na ndị Filistia eburula Igbe ahụ, Ilaị si n’oche dalaa azụ, gbajie olu ma nwụọ.—1 Samuel 4:1-18.

Iri afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, Samuel gbara ndị Izrel ume ka ha kwụsị ikpere arụsị. Ha mere ihe ọ gwara ha site n’ịtụfu arụsị ha, buo ọnụ ma kwupụta mmehie ha. Samuel kpeere ha ekpere ma chụọrọ ha àjà nsure ọkụ. Gịnị si n’ime ya pụta? Mgbe ndị Filistia bịara ịlụso ndị Izrel agha, Chineke tinyere ọgba aghara n’etiti ha, ndị Izrel merikwara ha n’agha ahụ. Ọnọdụ ndị Izrel bịara ka nnọọ mma n’ihi na Jehova kwadoro ha, ha nataghachiri ókèala ha ndị Filistia naara ha.—1 Samuel 7:3-14.

N’ezie, Samuel kwalitere ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, ọ hụrụ na e ji ụfọdụ n’ime ihe ndị a kwatara n’agha rụzie ụlọikwuu ahụ. O nyere aka hazie Ememe Ngabiga na ozi ndị Livaị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá na-eje. (1 Ihe E Mere 9:22; 26:27, 28; 2 Ihe E Mere 35:18) Samuel na-esi n’ụlọ ya dị na Rema aga ekpe ikpe n’obodo dị iche iche kwa afọ. A maara ya dị ka onye na-akwụwa aka ọtọ na onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu. O nyeere ndị mmadụ aka ife Chineke n’ihi na ha kwanyeere ya ùgwù. (1 Samuel 7:15-17; 9:6-14; 12:2-5) O doro anya na ịkwụwa aka ọtọ ya na ofufe o fere Chineke kpaliri nnọọ ọtụtụ ndị ịgbaso ihe nlereanya ya. Ndụ Samuel ọ̀ na-akpali gị iṅomi ihe nlereanya ya?

Izrel Rịọrọ Ka E Nye Ha Eze

Mgbe Samuel mere agadi, ọ họpụtara ụmụ ya bụ́ Joel na Abaịja ịbụ ndị ikpe. Ụmụ ya “ejeghịkwa ije n’ụzọ ya nile, ha wee wezụga onwe ha soro uru na-ezighị ezi, ha wee nara ihe iri ngo, wezụga ikpe.” Àgwà ha mere ka ndị okenye Izrel rịọ ka e nye ha eze. (1 Samuel 8:1-5) Nke a jọrọ njọ n’anya Samuel. Ma, mgbe o kpegaara Jehova ekpere banyere ya, Jehova gwara ya, sị: “Ọ bụghị gị ka ha jụworo, kama ọ bụ Mụ ka ha jụworo, ka M ghara ịbụrụ ha eze.” (1 Samuel 8:6, 7) Chineke gwara Samuel ka o meere ha ihe ha rịọrọ ma mee ka ha mata na mgbe ha nwere eze, eze ahụ ga-anapụ ha ihe ụfọdụ ruuru ha. Mgbe ha nọgidere na-arịọ ka e nye ha eze, Jehova mere ndokwa ka Samuel gaa tee Sọl mmanụ ịbụ eze.—1 Samuel 8:6–22; 9:15-17; 10:1.

Samuel kwadoro ndokwa a n’agbanyeghị na ọ kaghị ya obi. Mgbe ndị Izrel merichara ndị Amọn n’agha, Samuel kpọkọtara ndị Izrel na Gilgal ka ha meghachi Sọl eze. (1 Samuel 10:17-24; 11:11-15) Samuel kọghachiri akụkọ ihe mere eme nke ndị Izrel, ọ gbakwara ndị Izrel na eze ha ume irubere Jehova isi. Chineke zara ekpere Samuel site n’ime ka e nwee égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo n’oge na-abụghị oge mmiri bụ́ nke e kwuru banyere ya ná mmalite. Égbè eluigwe na oké mmiri ozuzo ahụ mere ka ndị Izrel kweta na ha emehiela site n’ịjụ Jehova. Mgbe ha gwara Samuel ka o kpeere ha ekpere, ọ zara, sị: “Ya bụrụ ihe arụ, bụ́ ka m mehie megide Jehova n’ịgha ikpe ekpere banyere unu: ma m ga-ezi unu ihe n’ụzọ ahụ dị mma nke ziri ezi.” Lee nnọọ ihe nlereanya nke ịhụ Jehova na ndị ya n’anya Samuel setịpụụrụ anyị. (1 Samuel 12:6-24) Ị̀ dị nnọọ njikere ịkwado ndokwa ndị Chineke mere na ikpere ndị kwere ekwe ibe gị ekpere otú ahụ Samuel mere?

Mmadụ Abụọ Mbụ Chịrị Izrel

Sọl bụ nwoke dị obi umeala Chineke nwapụtara. (1 Samuel 9:21; 11:6) Ma mgbe oge na-aga, ọ kwụsịrị ige Chineke ntị. Dị ka ihe atụ, Samuel baara ya mba n’ihi ime ngwa ngwa chụọ àjà n’echereghị ya, dị ka e nyere ya n’iwu. (1 Samuel 13:10-14) Mgbe Sọl nupụrụ isi site n’ịhapụ Eze Egag nke Amalek ndụ, Samuel gwara ya, sị: “Jehova adọwapụwo alaeze Izrel n’ahụ́ gị taa, nye ya mmadụ ibe gị, nke dị mma karịa gị.” Samuel gburu Egag n’onwe ya ma laa na-eruru Sọl újú.—1 Samuel 15:1-35.

Jehova mesịrị gwa Samuel, sị: “Ruo ole mgbe ka gị onwe gị ga na-eruru Sọl újú, ebe Mụ onwe m jụworo ya ka ọ ghara ịbụ eze Izrel?” Mgbe ahụ Jehova zigara Samuel Betlehem ịga tee otu nwa Jesi mmanụ ịbụ eze. Samuel tụlere ụmụ Jesi otu otu ruo mgbe Jehova kwuru ka Samuel tee nwa ikpeazụ Jesi bụ́ Devid mmanụ. N’ụbọchị ahụ, Samuel mụtara otu ihe dị mkpa: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:1-13.

Ebe ọ bụ na nnupụisi Sọl wutere Samuel, ọ ghaghị nnọọ iwute ya mgbe Sọl nọ na-achọ igbu Devid n’ihi asị ọ kpọrọ ya! N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ, Samuel nọgidere na-anụ ọkụ n’obi n’oge agadi ya, o mekwara ihe nile o nwere ike ime n’ozi Jehova.—1 Samuel 19:18-20.

Ihe Nlereanya Samuel

Mgbe Samuel nwụrụ, ndị Izrel ruuru onye amụma a dị umeala n’obi ma nwee obi ike nke ihe nlereanya ya baara ọtụtụ mmadụ uru újú. (1 Samuel 25:1) Samuel ezughị okè, o mekwara mkpebi ndị na-ezighị ezi mgbe ụfọdụ. Ma, n’agbanyeghị adịghị ike ya, o fere nanị Jehova ofufe ma rụsie ọrụ ike inyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ.

Ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe oge Samuel, ma akụkọ ndị e dekọrọ banyere ndụ ya ka baara anyị ezigbo uru. Nke kasị mkpa bụ na Samuel fere Jehova ma kwalite ezi ofufe ya. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ị na-eme?

[Igbe dị na peeji nke 16]

CHEBARA NDỤ SAMUEL ECHICHE

• Dị ka nne na nna Samuel kụziiri ya Okwu Chineke, na-azụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

• Na-agba ụmụ gị ume iṅomi Samuel site n’iji ozi Jehova mere aka ọrụ.

• Nṅomi Samuel ṅomiri Chineke mere ka ndị ọzọ hụ ya n’anya, o sikwa otú ahụ setịpụrụ anyị ihe nlereanya.

• Samuel mere ihe nile o nwere ike ime iji kwalite ezi ofufe, dịkwa nnọọ ka anyị kwesịrị ime.

[Foto dị na peeji nke 15]

Samuel kwalitere ezi ofufe ma jiri obi ya nile nyere ndị ọzọ aka ịtụ egwu Chineke