Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa

LEE otú ọdachi ndị Jeremaịa kpọsara ga-adakwasị ndị ya na-aghaghị isiwo wụọ ha akpata oyi n’ahụ́! A gaje ịgba ụlọ nsọ dị ebube ha nọworo na ya fee ofufe ruo ihe karịrị narị afọ atọ ọkụ. Obodo Jeruselem na ala Juda ga-atọgbọrọ n’efu, a ga-adọrọkwa ndị bi na ha n’agha. E dekọrọ ihe ndị a na ozi amamikpe ndị ọzọ n’akwụkwọ Bible nke abụọ kasị buo ibu, bụ́ Jeremaịa. Akwụkwọ ahụ kọkwara ihe mere Jeremaịa ka o ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo afọ 67 dị ka onye amụma. E deghị ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ dabere na mgbe ha ji mee, kama nke ahụ, e dere ha dabere n’otú ihe ndị merenụ si metụta ibe ha.

Gịnị mere akwụkwọ Bible bụ́ Jeremaịa ga-eji amasị anyị? Amụma ya ndị mezuru emezu na-eme ka okwukwe anyị nwere na Jehova dị ka Onye na-emezu nkwa ya sie ike. (Aịsaịa 55:10, 11) Ọrụ Jeremaịa rụrụ dị ka onye amụma na ihe ndị mmadụ mere banyere ozi ya yiri ihe na-eme n’oge anyị a. (1 Ndị Kọrint 10:11) Ọzọkwa, ihe ndekọ nke otú Jehova si mesoo ndị ya ihe na-egosipụta àgwà ndị o nwere, o kwesịkwara imetụta anyị nke ukwuu.—Ndị Hibru 4:12.

“IHE ỌJỌỌ ABỤỌ KA NDỊ M MEWORO”

(Jeremaịa 1:120:18)

Jeremaịa ghọrọ onye amụma n’afọ nke 13 nke ọchịchị Josaịa, bụ́ eze Juda, ya bụ afọ 40 tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. (Jeremaịa 1:1, 2) Ihe ka ọtụtụ n’ozi ndị ọ kpọsara n’afọ 18 ikpeazụ nke ọchịchị Josaịa kpughere ajọ omume Juda ma gosi ikpe Jehova mara ya. Jehova kwuru, sị: “M ga-emekwa Jeruselem ka ọ ghọọ obo ihe obo ihe, . . . ọzọ, obodo nile nke Juda ka M ga-eme ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, onye obibi wee ghara ịdị.” (Jeremaịa 9:11) N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “N’ihi na ihe ọjọọ abụọ ka ndị m meworo.”—Jeremaịa 2:13.

Ozi ahụ bụkwa banyere nlọghachi nke ndị fọdụrụnụ chegharịrị echegharị. (Jeremaịa 3:14-18; 12:14, 15; 16:14-21) Otú ọ dị, a nabataghị onye ozi ahụ nke ọma. “Onye nlekọta, onye ndú n’ụlọ Jehova” tiri Jeremaịa ihe ma tinye ya n’ọtọsị ruo echi ya.—Jeremaịa 20:1-3.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:11, 12—Gịnị mere e ji jikọta Jehova ịmụ anya na “mkpanaka nke osisi almọnd”? Osisi almọnd bụ “otu n’ime osisi ndị mbụ na-ama ifuru n’oge opupu ihe ubi.” (Amaokwu nke 11, ihe odide ala ala peeji nke NW) Jehova nọgidere n’ụzọ ihe atụ “na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite [ndị amụma ya]” ịdọ ndị ya aka ná ntị banyere ikpe ya, ma “na-amụ anya” ruo mgbe ha mezuru.—Jeremaịa 7:25.

2:10, 11—Olee ihe mere omume ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ji dịbiga njọ ókè? Ọ bụ ezie na mba ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ site n’Izrel ruo Kitim na ndị dị ya n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Kida bụ́cha ndị na-ekpere arụsị nwere ike iwebata chi ndị mba ọzọ tinye ná ndị nke ha nweburu enwe, ọ dịtụghị mgbe ha ga-eji ha dochie chi ndị nke ha kpamkpam. Otú ọ dị, ndị Izrel hapụrụ Jehova, na-etozi arụsị ndị na-adịghị ndụ kama ito Chineke dị ndụ.

3:11-22; 11:10-12, 17—Gịnị mere Jeremaịa ji gụnye alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu ná mkpọsa ahụ o mere, n’agbanyeghị na Sameria adaala kemgbe afọ 740 T.O.A.? Nke a bụ n’ihi na mbibi Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. bụ ngosipụta nke ikpe Jehova mara mba Izrel nile, ọ bụghị nanị nke ọ mara ndị Juda. (Ezikiel 9:9, 10) Ọzọkwa, mgbe alaeze ebo iri dasịrị, a nọgidere na-enwe ihe nnọchianya ya na Jeruselem, ebe ọ bụ na ozi nke ndị amụma Chineke nọgidere na-agụnye ụmụ Izrel.

4:3, 4—Olee ihe iwu a pụtara? Ọ dị mkpa ka ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi dozie obi ha, mee ka ọ dị nro, meekwa ka ọ dị ọcha. Ha kwesịrị ibi onwe ha “úgwù” n’obi, ya bụ, iwepụ echiche, mmetụta, na ebumnobi ọjọọ nile. (Jeremaịa 9:25, 26; Ọrụ 7:51) Nke a pụtara na ha ga-agbanwe otú ha si ebi ndụ—site n’ịhapụ ihe ọjọọ ha na-eme ma mewe ihe ga-eme ka Chineke gọzie ha.

4:10; 15:18—Olee otú o si bụrụ na Jehova rafuru ndị ya na-enupụ isi? N’oge Jeremaịa, e nwere ndị amụma ‘na-ebu amụma ụgha.’ (Jeremaịa 5:31; 20:6; 23:16, 17, 25-28, 32) Jehova egbochighị ha ịkpọsa ozi nduhie.

16:16—Gịnị ka Jehova “iziga kpọọ ọtụtụ ndị ọ́kụ̀” na “ọtụtụ ndị ntá” pụtara? Nke a nwere ike ịpụta iziga ndị agha bụ́ ndị iro ịga chọpụta ndị Juu na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị Jehova ga-ama ikpe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e jiri ihe Jeremaịa 16:15 kwuru tụlee ya, amaokwu ahụ nwekwara ike ịpụta ịchọpụta ndị Izrel chegharịrị echegharị.

20:7—Olee ụzọ Jehova si “nwee ike karịa” Jeremaịa wee raa ya ụrà? N’ihi enweghị mmasị, ọjụjụ, na mmegide Jeremaịa nwetara mgbe ọ na-ekwusa ikpe Jehova, ọ pụrụ ịbụ na o chere na ya enwekwaghị ike iji nọgide na-eje ozi. Otú ọ dị, Jehova ji ike ya mee ka Jeremaịa kwụsị iche ụdị echiche ahụ, site n’inye ya ikike iji gaa n’ihu. Jehova si otú ahụ raa Jeremaịa ụrà site n’iji ya mezuo ihe onye amụma ahụ chere na ya agaghị emeli.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:8. Jehova nwere ike ịnapụta ndị ya ná mkpagbu mgbe ụfọdụ—eleghị anya site n’iji ndị ikpe dị obiọma kpelaara ha ikpe, site n’iji ndị ọchịchị na-ekpe ikpe ziri ezi dochie ndị nke nwere obi ọjọọ, ma ọ bụ site n’inye ndị na-efe ya ofufe ike iji na-atachi obi.—1 Ndị Kọrint 10:13.

2:13, 18. Ndị Izrel na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi mere ihe ọjọọ abụọ. Ha hapụrụ Jehova, bụ́ onye o doro anya na ọ bụ ya na-agọzi ha, na-eduzi ma na-echebe ha. Ha gwukwaara onwe ha olulu mmiri ihe atụ site n’ịga ka ha na ndị Ijipt na ndị Asiria gbakọọ aka n’agha. N’oge anyị a, ịhapụ ezi Chineke n’ihi nkà ihe ọmụma na nchepụta echiche ụmụ mmadụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa bụ iji “olulu mmiri tipuru etipu” dochie anya “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.”

6:16. Jehova gbara ndị ya nupụrụ isi ume ka ha kwụsịtụ, nyochaa onwe ha, ma laghachi ‘n’okporo ụzọ nile’ nke ndị nna nna ha kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị na-enyocha onwe anyị site n’oge ruo n’oge iji mara ma ànyị na-eje ije n’ezie n’ụzọ ahụ Jehova chọrọ ka anyị na-eje ije na ya?

7:1-15. Ndị Juu ịtụkwasị ụlọ nsọ ahụ obi, were ya dị ka ọgwụ na-echebe ha, emeghị ka a zọpụta ha. Anyị kwesịrị ije ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.—2 Ndị Kọrint 5:7.

15:16, 17. Anyị nwere ike ịgba mgba megide nkụda mmụọ dị ka Jeremaịa mere. Anyị nwere ike ime otú ahụ site n’ime ka ịmụsi Bible ike na-atọ anyị ụtọ, site n’ibuli aha Jehova elu n’ozi anyị, nakwa site n’izere ndị enyi ọjọọ.

17:1, 2. Mmehie ndị Juda mere ka àjà ha na-achụrụ Jehova ghara ịtọ ya ụtọ. Omume na-adịghị ọcha na-eme ka Jehova ghara ịnabata àjà otuto anyị na-achụrụ ya.

17:5-8. Nanị mgbe anyị kwesịrị ịtụkwasị ụmụ mmadụ na òtù dị iche iche obi bụ mgbe ha mere ihe kwekọrọ n’uche na ụkpụrụ Chineke. Mgbe a bịara n’ihe banyere ihe ndị dị ka nzọpụta na ezi udo na nchebe, ọ bụụrụ anyị ihe amamihe ịtụkwasị nanị Jehova obi.—Abụ Ọma 146:3.

20:8-11. Anyị ekwesịghị ikwe ka enweghị mmasị, mmegide, ma ọ bụ mkpagbu mee ka ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ nkwusa Alaeze jụọ oyi.—Jems 5:10, 11.

“MEENỤ KA OLU UNU BAA NA YOK NKE EZE BABILỌN”

(Jeremaịa 21:1-51:64)

Jeremaịa kpọsara ikpe a mara eze anọ ikpeazụ nke Juda, ndị amụma ụgha, ajọ ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị nchụàjà omume ha rụrụ arụ. Mgbe Jehova na-ekwu banyere ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ezi fig, O kwuru, sị: “N’ihi na M ga-atụkwasị ha anya m ime ha mma.” (Jeremaịa 24:5, 6) Amụma atọ e dekọrọ n’isi nke 25 chịkọtara ikpe ọmụma ndị e kwupụtara n’ozuzu n’isiakwụkwọ ndị sochirinụ.

Ndị nchụàjà na ndị amụma gbara izu igbu Jeremaịa. Ọ gwara ha na ha aghaghị ife eze Babilọn. Jeremaịa gwara Eze Zedekaịa, sị: “Meenụ ka olu unu baa na yok nke eze Babilọn.” (Jeremaịa 27:12) Otú ọ dị, “Onye na-efesa Izrel ga-achịkọta ya [Izrel].” (Jeremaịa 31:10) E kwere ndị Rikab nkwa n’ihi ezi ihe ha mere. E tinyere Jeremaịa “n’ogige ụlọ nche.” (Jeremaịa 37:21) E bibiri Jeruselem, dọrọkwa ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya n’agha. Jeremaịa na odeakwụkwọ ya bụ́ Beruk so ná ndị a hapụru. N’agbanyeghị na Jeremaịa dọrọ ndị obodo ya ụjọ ji aka ná ntị ka ha ghara ịgbaga Ijipt, ha kpọchiri ntị gbaga ebe ahụ. Isi nke 46 ruo nke 51 kwuru amụma Jeremaịa buru banyere mba dị iche iche.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

22:30—Iwu a, ọ̀ kagburu oruru o ruuru Jizọs Kraịst ịnọkwasị n’ocheeze Devid? (Matiu 1:1, 11) Ee e, ọ kagbughị ya. Iwu ahụ gbochiri onye ọ bụla sitere n’ezinụlọ Jehoịakin ‘ịnọkwasị n’ocheeze Devid na Juda.’ Jizọs ga-achị site n’eluigwe, ọ bụghị site n’ocheeze dị na Juda.

23:33—Gịnị bụ “ibu Jehova na-ebu”? Okwu ikpe ahụ dị oké mkpa Jeremaịa onye amụma kpọsara banyere mbibi Jeruselem, bụụrụ ụmụ amaala ibe ya bi n’oge ya ibu. Ọ bụkwa otú ahụ ka ndị ahụ kpọrọ ekwe nkụ si bụụrụ Jehova ibu nke na ọ jụrụ ha. N’otu aka ahụ, ozi sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere mbibi Krisendọm nke na-abịanụ bụ ibu nye Krisendọm, ndị jụkwara ịṅa ntị n’ozi ahụ, bụ ibu arọ nye Chineke.

31:33—Olee otú e si dee iwu Chineke n’obi? Mgbe mmadụ hụrụ iwu Chineke n’anya nke ukwuu nke na ọ na-achọsi ike ime uche Jehova, a pụrụ ikwu na e dere iwu Chineke n’obi ya.

32:10-15—Olee ihe mere e ji ede akwụkwọ ala abụọ maka otu ala? Nke ghere oghe bụ nke e nwere ike ịgụ iji mata ihe e kpebiri. Nke e mechiri emechi bụ nke e chebere iji hụ na e nwere ebe a ga-ele anya iji mara ma nke ahụ ghere oghe ọ̀ bụkwa eziokwu ma ọ dị mkpa ime otú ahụ. Jeremaịa setịpụụrụ anyị ihe nlereanya site n’ịgbaso ihe iwu chọrọ ọbụna mgbe ya na onye ikwu ya na onye ya na ya na-efekọ Jehova na-emekọ ihe.

33:23, 24—Olee “agbụrụ abụọ” ebe a na-ekwu banyere ha? Otu bụ agbụrụ ndị eze nke si n’usoro ọmụmụ Eze Devid, nke ọzọ abụrụ agbụrụ ndị nchụàjà nke si n’ụmụ Erọn. Mgbe e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ Jehova, o yiri ka Jehova ọ̀ jụrụ agbụrụ abụọ ahụ, nakwa na ọ gaghị enwekwa alaeze n’ụwa ma ọ bụ na ọ dịghị mgbe a ga-emesị maliteghachi ife ya ofufe.

46:22—Olee ihe mere e ji jiri olu Ijipt tụnyere nke agwọ? O nwere ike ịbụ na nke a na-ezo aka n’ụzụ agwọ na-eme mgbe ọ na-agba ọsọ ma ọ bụ olu dị ala mba ahụ nweziri n’ihi ọdachi ndị dakwasịrị ya. Ihe abụọ ahụ e ji tụnyere ibe ha na-egosikwa na ihe nnọchianya nke agwọ dị nsọ bụ́ nke ndị Fero Ijipt na-eke n’elu ákwà isi ha, nke ha weere dị ka ihe nchebe sitere n’aka chi nwanyị agwọ bụ́ Uatchit, bụ ihe efu.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

21:8, 9; 38:19. Obere oge tupu e bibie Jeruselem, Jehova nyere ndị ahụ bi na Jeruselem na-achọghị ichegharị echegharị, bụ́ ndị kwesịrị ịnwụ anwụ, ohere ịgbanwe. Ee, “obi ebere Ya bara ụba.”—2 Samuel 24:14; Abụ Ọma 119:156.

31:34. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova anaghị echeta mmehie ndị ọ gbaghaara ndị mmadụ ma mesịa taa ha ahụhụ maka mmehie ndị ahụ!

38:7-13; 39:15-18. Jehova anaghị echefu ozi anyị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere ya, bụ́ nke na-agụnye ‘ijere ndị nsọ ozi.’—Ndị Hibru 6:10.

45:4, 5. Dị ka ọ dị n’ụbọchị ikpeazụ nke Juda, ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke ụwa anyị a abụghị oge iji chọọ “ihe ukwu,” dị ka akụnụba, ịbụ onye a na-anụ aha ya, ma ọ bụ ihe onwunwe.—2 Timoti 3:1; 1 Jọn 2:17.

A GBAA JERUSELEM ỌKỤ

(Jeremaịa 52:1-34)

N’afọ 607 T.O.A., bụ́ afọ nke 11 nke ọchịchị Zedekaịa, Eze Nebukadneza nke Babilọn anọchibidola Jeruselem ruo ọnwa iri na asatọ. N’abalị asaa nke ọnwa ise nke afọ nke 19 nke ọchịchị Nebukadneza, Nebuzaradan, bụ́ onyeisi ndị ogbu, “bịaruru” Jeruselem. (2 Ndị Eze 25:8) Eleghị anya Nebuzaradan nọ n’ụlọikwuu ya dị ná mpụga obodo ahụ hụ otú ihe si dịrị ma mee atụmatụ ihe ọ ga-eme. Mgbe abalị atọ gasịrị, n’abalị iri nke ọnwa ahụ, ọ ‘batara,’ na Jeruselem. Ọ gbakwara obodo ahụ ọkụ.—Jeremaịa 52:12, 13.

Jeremaịa kọrọ ihe nile banyere otú Jeruselem si daa. Otú o si kọọ akụkọ ahụ mere ka a bụọrọ ya abụ ákwá. E dekọrọ ihe ndị a n’akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ákwá.

[Foto dị na peeji nke 8]

Amụma Jeremaịa buru gụnyere ikpe Jehova mara Jeruselem

[Foto dị na peeji nke 9]

Olee otú Jehova si “nwee ike” karịa Jeremaịa?

[Foto dị na peeji nke 10]

“Dị ka ezi fig ndị a, otú a ka M ga-amata ndị Juda e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ.”—Jeremaịa 24:5