Ị̀ Na-esosi Kraịst Ike?
Ị̀ Na-esosi Kraịst Ike?
‘Dị nnọọ ka unu na-eje ije n’eziokwu, na-emenụ ya n’ụzọ zuru ezu karị.’—1 TESA. 4:1.
1, 2. (a) Olee ihe pụrụ iche ọtụtụ mmadụ hụrụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa a? (b) Olee ihe mere oge anyị a jikwa pụọ iche?
ÌCHETỤLA otú obi gaara adị gị ma à si na ị nọ n’ụwa mgbe Jizọs bịara n’ụwa? I nwere ike iche banyere otú Jizọs gaara esi agwọ gị ọrịa ka ọrịa na-enye gị nsogbu wee laa. Ma ọ bụkwanụ, ọ gaara adịkwu gị mma ịhụ Jizọs na ịnụ olu ya ka i wee mụta ihe n’aka ya ma ọ bụkwanụ hụ mgbe ọ na-arụ ọrụ ebube. (Mak 4:1, 2; Luk 5:3-9; 9:11) Ọ bụ ihe ùgwù dị ukwuu mmadụ ịnọ hụ mgbe Jizọs na-arụ ọrụ ndị ahụ niile. (Luk 19:37) Kemgbe ahụ, o nweghị ndị ọzọ hụrụla ụdị ihe ndị ahụ Jizọs rụrụ ma e wezụga ndị nọ ndụ mgbe ọ rụrụ ha, a gaghịkwa arụghachi ihe o ji ‘ịchụ onwe ya n’àjà’ rụọ.—Hib. 9:26; Jọn 14:19.
2 Oge anyị a pụkwara iche n’ụdị nke ya. Olee ihe o ji pụọ iche? Anyị nọ ugbu a n’oge Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ (Dan. 12:1-4, 9; 2 Tim. 3:1) Ọ bụ n’oge a ka e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa. N’oge na-adịghị anya, a ga-eke ya agbụ tụba ya “n’ime abis.” (Mkpu. 12:7-9, 12; 20:1-3) Ọ bụkwa n’oge a ka anyị nwere ihe ùgwù na-enweghị atụ nke izisa ‘ozi ọma nke alaeze’ n’ụwa niile, bụ́ nke anyị na-ezi ndị mmadụ wee na-agwa ha banyere Paradaịs ga-abịa n’ọdịnihu, bụ́ ọrụ a na-agaghị arụ ọzọ.—Mat. 24:14.
3. Nwa obere oge tupu Jizọs alaghachi eluigwe, gịnị ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee, gịnịkwa ka nke a pụtara?
3 Nwa obere oge tupu Jizọs alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-abụkwa Ọrụ 1:8) Nke a pụtara na a ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa niile. Gịnị mere e ji arụ ọrụ a? Ọ bụ iji mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ya bụ, inweta ndị ọzọ ga-eso ụzọ Kraịst tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 28:19, 20) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụ ọrụ a Kraịst nyere anyị nke ọma?
ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (4. (a) Gịnị ka ihe Pita kwuru, nke dị na Pita nke abụọ isi atọ amaokwu nke iri na otu na iri na abụọ na-eme ka ọ pụta ìhè? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ilezi anya na-eme?
4 Tụlee ihe a Pita onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:11, 12) Ihe Pita kwuru na-echetara anyị na ọ dị mkpa ka anyị nọrọ ná nche n’oge ikpeazụ a ka anyị wee nọgide na-eme omume na-egosi na anyị e jighị ịsọpụrụ Chineke egwuri egwu. Nke a gụnyere ikwusa ozi ọma. Anyị na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ma anyị na-ahụ otú ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ Kraịst nyere anyị iwu ka anyị na-ekwusa. Anyị kwesịrị ilezi anya ka otú ihe si aga n’ụwa Setan kwa ụbọchị nakwa anụ ahụ́ anyị na-esighị ike ghara ime ka ịnụ ọkụ n’obi anyị ji ekwusa ozi ọma malite ibelata. Ya mere, ka anyị tụlee otú anyị kwesịrị isi na-eso Kraịst.
Jiri Obi Ụtọ Nara Ọrụ Chineke Nyere Gị
5, 6. (a) Gịnị mere Pọl ji jaa ụmụnna ya nọ na Jeruselem mma, gịnịkwa ka o ji maka ya dọọ ha aka ná ntị? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ọrụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe?
5 Pọl onyeozi ji akwụkwọ o degaara Ndị Kraịst nọ na Jeruselem jaa ha mma maka otú ha si tachie obi mgbe a na-akpagbu ha. Ọ sịrị: “Na-echetanụ ụbọchị ndị gara aga, bụ́ mgbe unu tachiri obi n’oké ịgba mgba ka unu nọ na-ata ahụhụ.” N’ezie, Jehova echefughị otú ha si tachie obi. (Hib. 6:10; 10:32-34) Ọ ghaghị ịbụ na mma Pọl ji ịhụnanya jaa ụmụnna ndị Hibru ahụ gbara ha ume nke ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl dọrọ ha aka ná ntị n’otu akwụkwọ ozi ahụ banyere omume ụmụ mmadụ na-eme nke nwere ike ime ka ịnụ ọkụ n’obi mmadụ ji ejere Chineke ozi belata ma ọ bụrụ na onye ahụ akpacharaghị anya. O kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ‘ịjụ irubere’ Chineke isi.—Hib. 12:25.
6 Ịdọ aka ná ntị ahụ Pọl dọrọ ndị Hibru banyere mmadụ ‘ịjụ’ ọrụ Chineke nyere ya gbasakwara Ndị Kraịst taa. Anyị kwesịrị ikpebi na o nweghị ihe ga-eme ka anyị jiri ọrụ Chineke nyere anyị gwuo egwu ma ọ bụkwanụ kwe ka ịnụ ọkụ n’obi anyị ji ejere ya ozi belata. (Hib. 10:39) Anyị kwesịrị ime nke a n’ihi na ozi anyị na-ejere Chineke na-azọpụta ndụ.—1 Tim. 4:16.
7, 8. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị wee nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi? (b) Ọ bụrụ na anyị ejighịzi ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi, gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere Jehova na Jizọs?
7 Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịjụ ọrụ Chineke nyere anyị? Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gbasie mgba ike wee na-arụ ọrụ Chineke nyere anyị bụ ịtụgharị uche mgbe niile n’ihe nkwa anyị kwere Chineke mgbe anyị raara onwe anyị nye ya pụtara. Ihe anyị kwere Chineke ná nkwa mgbe ahụ bụ na anyị ga-ebute ime uche ya ụzọ ná ndụ anyị, anyị kwesịkwara ime nke a. (Gụọ Matiu 16:24.) Ya mere, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịkwụsị mgbe ụfọdụ ma jụọ onwe ya, sị: ‘M̀ ka kpebisiri ike ịna-eme ihe kwekọrọ ná nrara m raara onwe m nye Chineke dị ka m kpebiri tupu e mee m baptizim? Ka ịnụ ọkụ n’obi m ji ejere Chineke ozi ò belatala kemgbe ahụ?’
8 Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ọcha tụlechaa onwe anyị wee chọpụta na anyị anaghị anụchazi ọkụ n’obi n’ozi Jehova dị ka anyị Zef. 3:16, 17) A gwara ụmụ Izrel oge ochie okwu a na-emesi obi ike mgbe ha si Babịlọn lọta Jeruselem. Ma, okwu a gbasakwara ndị Chineke taa. Ebe ọrụ anyị na-arụ bụ ọrụ Jehova, anyị kwesịrị icheta na Jehova na Ọkpara ya nọnyeere anyị, na-enyekwa anyị ume anyị ga-eji rụọ ya nke ọma. (Mat. 28:20; Fil. 4:13) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ Chineke, ọ ga-agọzi anyị, nyekwara anyị aka inwe ọganihu n’ọgbakọ ya.
na-emebu, ọ ga-adị mma ma anyị cheta okwu ahụ na-agba ume Zefanaya onye amụma kwuru. Ọ sịrị: “Enwela nkụda aka. Jehova bụ́ Chineke gị nọ n’etiti gị. Dị ka Dike, ọ ga-azọpụta gị. Ọ ga-enwe aṅụrị n’ihi gị.” (Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Buru Ụzọ “Na-achọ Alaeze Ahụ”
9, 10. Gịnị bụ isi ihe atụ ahụ Jizọs ji otu nnukwu nri anyasị mee, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta na ya?
9 Mgbe Jizọs nọ na-eri nri n’ụlọ otu onye na-achị achị bụ́ onye Farisii, o nyere ihe atụ banyere otu nnukwu nri anyasị. N’ihe atụ ahụ, o gosiri otú e si nye ndị dị iche iche ohere ka ha soro ná ndị ga-eketa Alaeze eluigwe. O kwukwara ihe arịrịọ ha rịọrọ “ka a hapụ ha” pụtara. (Gụọ Luk 14:16-21.) N’ihe atụ ahụ Jizọs mere, ndị ahụ a kpọrọ òkù kwuru ihe dị iche iche mere ha agaghị eji bịa oriri ahụ. Otu sịrị na ya ga-aga hụ ubi ya zụrụ n’oge na-adịbeghị anya. Onye nke ọzọ asị na ya ga-aga ileru ehi ndị ya zụrụ anya. Onye ọzọ asịkwa: ‘Apụghị m ịbịa. M ka lụrụ nwaanyị ọhụrụ.’ O nweghị nke rijuru afọ n’ime ihe ndị a niile. Onye zụrụ ubi ma ọ bụ anụ ụlọ na-ebu ụzọ eleru ya anya, n’ihi ya, ịga leruwe ya anya mgbe a zụcharala ya azụ adịghị mkpa. Na mmadụ lụrụ nwaanyị ọhụrụ ekwesịghị ime ka onye ahụ ghara ịza òkù ahụ dị mkpa a kpọrọ ya. Ọ bụ ya mere iwe ji ju nwoke ahụ kpọrọ ha òkù obi.
10 Ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịmụta ihe n’ihe atụ ahụ Jizọs mere. Gịnị ka ha kwesịrị ịmụta? Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị anyị na-eme ná ndụ, ndị dị ka ndị ahụ Jizọs kwuru banyere ha n’ihe atụ ahụ, dịrị anyị mkpa karịa ozi anyị na-ejere Chineke nke na ha ga-egbochi anyị ijere ya ozi. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ebute ihe ndị a ụzọ, ịnụ ọkụ n’obi o ji eje ozi ọma ga-eji nke nta nke nta kwụsị. (Gụọ Luk 8:14.) Ihe ga-enyere anyị aka igbochi nke a bụ ime ihe ahụ Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.” (Mat. 6:33) Ọ magburu onwe ya ịhụ na ndị ohu Chineke, ma ụmụaka ma ndị okenye, na-eme ihe a Jizọs kwuru. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị ahazigharịala ndụ ha wee hapụ ịchụ ọtụtụ ihe ka ha wee nwekwuo ohere na-eje ozi ọma. Nke a emeela ka ha chọpụta na mmadụ iji ịnụ ọkụ n’obi “na-achọ alaeze ahụ” ga-eme ka onye ahụ nwee ezigbo obi ụtọ na afọ ojuju na-enweghị atụ.
11. Olee akụkọ dị na Baịbụl, nke na-egosi na iji obi anyị niile nakwa ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi dị mkpa?
11 Iji gosi anyị na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi dị mkpa, cheta otu ihe nke mere ná ndụ Eze Jehoash nke chịrị Izrel. Jehoash beere ákwá bịakwute Ịlaịsha n’ihi na obi ya nọ na-agwa ya na ndị Siria nwere ike imeri Izrel n’agha. Ịlaịsha wee gwa ya ka o si na windo nke chere ihu n’ebe Siria dị gbapụ akụ́, bụ́ nke na-egosi na Jehova ga-enyere ha aka imeri Siria. Nke a kwesịrị ime ka obi sie Jehoash ike. Ịlaịsha wee gwa Jehoash ka o tie akụ́ ndị o ji n’aka n’ala. Jehoash etie ha naanị ugboro atọ. Nke a were Ịlaịsha nnukwu iwe, n’ihi na iti akụ́ ndị ahụ ugboro ise ma ọ bụ isii gaara apụta na ọ “ga na-egbu ndị Siria ruo mgbe ha gwụchara.” N’ihi nke a, Jehoash ga-emeri ha naanị ugboro atọ, ma, ọ gaghị emeri ha nke ọma. Jehoash emerighị ha nke ọma n’ihi na o jighị ịnụ ọkụ n’obi tie akụ́ ndị ahụ n’ala. (2 Eze 13:14-19) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Anyị ga-enweta ngọzi Jehova n’ụba naanị ma ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile nakwa ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi.
12. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-abịara anyị? (b) Kwuo otú i si erite uru n’ijechi ozi ọma anya.
12 Ihe isi ike ndị na-abịara anyị na-eme ka o siere anyị ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi. Ịkpata ihe ha na-eri na-esiri ọtụtụ ụmụnna anyị ike. Ndị nke ọzọ na-echegbu onwe ha n’ihi na ọrịa anaghị ekwe ha jeere Jehova ozi otú ha chọrọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime ihe ndị ga-enyere ya aka ka ọ nọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi ma na-esosi Kraịst ike. Biko, tụlee arọ nakwa amaokwu dị iche iche dị na Baịbụl, bụ́ ndị dị n’igbe bụ́ “Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịnọgide Na-eso Kraịst?” Chee echiche otú i nwere ike isi na-eme ha eme ruo otú ike kwere gị. Ọ ga-abara gị uru nke ukwuu ma ọ bụrụ na i mee otú ahụ. Ịgachi ozi ọma anya na-eme ka okwukwe anyị sie ike, meekwa ka anyị nwee obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala nke ọma. (1 Kọr. 15:58) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum na-ejere Chineke ozi, anyị ga-eburu “ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.”—2 Pita 3:12.
Jiri Obi Eziokwu Tụlee Otú Ihe Si Dịrị Gị
13. Olee ihe ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikpebi otú ọ ga-esi jiri mkpụrụ obi ya dum na-ejere Chineke ozi?
13 Ma, anyị kwesịrị ịmara na ihe na-egosi na mmadụ ji obi ya niile na-ejere Chineke ozi abụghị awa ole onye ahụ na-eje ozi ọma. Otú ihe si dịrị gị nwere ike ịdị iche n’otú o si dịrị onye ọzọ. Ọgịga mmadụ na-aga ozi ọma otu awa ma ọ bụ awa abụọ kwa ọnwa nwere ike ịdị Jehova ezigbo mma ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị ihe ahụ́ onye ahụ kwere ya ime. (Tụlee Mak 12:41-44.) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi eziokwu tụlee otú ihe si dịrị anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji mkpụrụ obi anyị dum na-ejere Chineke ozi. Anyị kwesịrị ịna-eche echiche dị ka Kraịst ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Gụọ Ndị Rom 15:5; 1 Kọr. 2:16) Gịnị ka Jizọs butere ụzọ ná ndụ ya mgbe ọ nọ n’ụwa? Ọ gwara ndị Kapaniọm, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43; Jọn 18:37) Ka otú Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi zisaa ozi ọma nyere gị aka ichebara otú ihe si dịrị gị echiche ka i wee mara ma ị̀ ga-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma.—1 Kọr. 11:1.
14. Olee otú anyị nwere ike isi wepụtakwuo oge na-aga ozi ọma?
14 Anyị nwere ike iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma ma ọ bụrụ na anyị elebara otú ihe si dịrị anyị anya nke ọma. (Mat. 9:37, 38) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ụmụ anyị ndị na-eto eto, bụ́ ndị gụchara akwụkwọ n’oge na-adịbeghị anya, amalitela ọrụ ịsụ ụzọ wee na-enwe ọṅụ nke ndị ọsụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma na-enwe. Ọ̀ ga-amasị gị inwe ụdị ọṅụ ahụ? Ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị atụleela otú ihe si dịrị ha wee kpebie ịkwaga ebe ọzọ ná mba ha ma ọ bụkwanụ na mba ọzọ, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ndị nke ọzọ amụtala asụsụ ọzọ ka ha wee nwee ike ịna-ezi ndị na-asụ asụsụ ahụ ozi ọma. N’agbanyeghị na iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ, ọ na-eweta nnukwu ngọzi, anyị nwekwara ike inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Tim. 2:3, 4; 2 Kọr. 9:6.
Ihe Nlereanya Ndị Dị na Baịbụl Ndị Anyị Ga-agbaso
15, 16. Olee ndị na-eso ụzọ Kraịst anyị ga-eṅomi ihe nlereanya ha, bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi?
15 Olee ihe ndị mechara ghọọ ndịozi Kraịst mere mgbe ọ gwara ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Baịbụl kwuru banyere Matiu, sị: “Ọ gbahapụkwara ihe niile, bilie wee soro ya.” (Luk 5:27, 28) O kwukwara banyere Pita na Andru, bụ́ ndị nọ na-akụ azụ̀, sị: “Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbụ ha wee soro ya.” Ndị ọzọ Jizọs hụrụ bụ Jems na Jọn, bụ́ ndị ha na nna ha nọ na-edozi ụgbụ ha. Olee ihe ha mere mgbe Jizọs kpọrọ ha? “Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbọ mmiri ahụ na nna ha wee soro ya.”—Mat. 4:18-22.
16 Ezigbo ihe nlereanya ọzọ bụ nke Sọl, bụ́ onye ghọrọ Pọl onyeozi. N’agbanyeghị na obi tara ya mmiri mgbe ọ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst, o mechara gbanwee wee ghọọ ‘arịa Jizọs họọrọ’ ka e jiri kwusaa aha ya. “Ozugbo ahụ, n’ụlọ nzukọ, [Pọl] malitere ikwusa Jizọs, na ọ bụ Onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Ọrụ 9:3-22) Pọl nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị na a kpagburu ya nke ukwuu.—2 Kọr. 11:23-29; 12:15.
17. (a) Olee ihe ị chọrọ ime ka i wee na-eso Kraịst? (b) Olee ngọzi ndị na-eru anyị aka maka na anyị ji obi anyị niile na ike anyị niile na-eme uche Jehova?
17 Anyị kwesịrị iṅomi ezigbo ihe nlereanya nke ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs setịpụrụ, wee zaa òkù Kraịst na-akpọ anyị ozugbo ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Hib. 6:11, 12) Olee ngọzi ndị na-abịara anyị ka anyị na-agba mbọ ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-esosi Kraịst ike? Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ maka na anyị na-eme uche Chineke, na-enwekwa afọ ojuju nke onye naara ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ nakwa ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ na-enwe. (Ọma 40:8; gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:1.) N’eziokwu, ka anyị na-agbasi mbọ ike na-eso Kraịst, anyị ga-enwe ezigbo ngọzi ndị dị ka obi iru ala na afọ ojuju. Anyị na Chineke ga-adịkwa ná mma, anyị ga-enwekwa olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—1 Tim. 4:10.
Ì Chetara?
• Olee ọrụ dị mkpa e nyere anyị ka anyị na-arụ, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya?
• Olee omume ụmụ mmadụ na-eme, bụ́ nke anyị na-aghaghị izere, ọ̀ bụkwa maka gịnị ka anyị ga-eji ezere ya?
• Olee ihe anyị kwesịrị iji obi eziokwu tụlee?
• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eso Kraịst?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]
Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịnọgide Na-eso Kraịst?
▪ Na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe ị na-agụ.—Ọma 1:1-3; 1 Tim. 4:15.
▪ Na-ekpe ekpere mgbe niile ka mmụọ Chineke nọnyere gị ma na-edu gị.—Zek. 4:6; Luk 11:9, 13.
▪ Gị na ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma na-akpa.—Ilu 13:20; Hib. 10:24, 25.
▪ Cheta na oge a abụghị oge anyị kwesịrị iji eti epele.—Efe. 5:15, 16.
▪ Echefula ntaramahụhụ nwere ike ịbịara onye na-ekweghị aza òkù Jizọs kpọrọ ya.—Luk 9:59-62.
▪ Na-atụgharị uche mgbe niile ná nkwa i kwere Jehova mgbe ị raara onwe gị nye ya, na-atụgharịkwa uche ná ngọzi niile na-abịara gị n’ihi na ị na-ejere ya ozi ma na-esosi Kraịst ike.—Ọma 116:12-14; 133:3; Ilu 10:22.