Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Idozi Akụ̀ Ndị A Hapụụrụ Anyị

Idozi Akụ̀ Ndị A Hapụụrụ Anyị

Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie

Idozi Akụ̀ Ndị A Hapụụrụ Anyị

Ọ DỊLA anya ndị ohu Jehova jeweere ya ozi. Ọ bụghị naanị n’akwụkwọ anyị ka anyị na-amata otú ndị ohu Jehova sirila jeere ya ozi. Anyị na-amatakwa nke a na foto, n’akwụkwọ ozi, n’akụkọ ndụ ndị mmadụ e dere ede, n’ihe ndị ọzọ gbasara ozi anyị na-ejere Jehova, n’ọrụ nkwusa anyị na-arụ, nakwa n’ihe ndị anyị mere n’oge ndị gara aga. Ma, olee uru idozi ihe ndị a na ilebaghachi anya n’ihe ndị anyị mere n’oge gara aga bara? A gwara ndị isi ezinụlọ n’Izrel oge ochie ka ha kụziere ụmụ ha iwu Jehova na ihe ọma niile Jehova meere ha ka ha wee “nwee obi ike n’ebe Chineke nọ.”—Ọma 78:1-7.

Ịtụle ihe ndị anyị mere n’oge aga enyerala anyị aka ịhụ otú nzube Jehova si na-emezu. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị mmegide gbalịrị ịkwụsị ọrụ a na-arụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, a chọtara akwụkwọ mpịakọta Eze Saịrọs ji nye ikike ka e wughachi ụlọ nsọ ahụ n’ụlọ a na-edebe ihe ndekọ nke dị n’isi obodo Midia, bụ́ Ekbatana. (Ezra 6:1-4, 12) Nke a mere ka e wughachi ụlọ nsọ ahụ otú Chineke kwuru na a ga-eme. Ebe ndị e dekọrọ ihe ndị mere n’oge gara aga nyekwaara Luk aka isi “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.”—Luk 1:1-4.

Òtù Na-achị Isi chọsikwara ike ka e dozie ihe ndị mere n’ọgbakọ Jehova n’oge ndị gara aga. Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru ihe mere o ji kwesị ka e dee ihe ndị mere n’ọgbakọ Jehova n’oge gara aga n’akwụkwọ, dozie ha, ma mee ka ndị nke oge a mara ha. Ọ sịrị: “Anyị kwesịrị ịma ebe anyị si tupu anyị enwee ike ịma ebe anyị na-aga.” N’ihi ya, n’oge na-adịbeghị anya, e hiwere Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk. Ngalaba a nọ n’okpuru Kọmitii Ide Ihe.

“Ọ́BỌ́ FOTO ANYỊ” NA “AKỤ̀ A HAPỤỤRỤ ANYỊ”

Ka oge na-aga, anyị na-echefu ọtụtụ ihe ndị mere n’oge gara aga n’ezinụlọ anyị, bụ́ nke nwere ike ime ka ọ dị ọtụtụ n’ime anyị ka ya bụrụ na e nwere ebe e dekọrọ ihe ndị ahụ. Na Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie, a na-agbasi mbọ ike idekọ ihe ndị anyị na-eme, bụ́ ndị na-ehiwanye nne, na idozi ha. E nwere ike iwere foto ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe ochie ka ihe ndị so ‘n’ọ́bọ́ foto anyị.’ Akwụkwọ ndị mbụ anyị bipụtara, akụkọ ndụ ndị na-agba ume, na ihe ụfọdụ ndị anyị ji rụọ ọrụ n’oge ndị gara aga, bụ́ ihe ndị baara anyị ezigbo uru, socha n’ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe ochie. Ihe ndị a bụ “akụ́ a hapụụrụ anyị,” bụ́ ndị na-echetara anyị ihe ndị mere n’oge gara aga n’ọgbakọ a, na-emekwa ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe ga-eme ọgbakọ a.

Anyị chọrọ iji isiokwu a bụ́ “Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie” kọọrọ gị otú ihe si aga na Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie. Ọ ga na-agba site n’oge ruo n’oge n’Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. Dị ka ihe atụ, n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2012, anyị na-eme atụmatụ ibipụta ihe ndị ga-aza ajụjụ ndị bụ́: Gịnị bụ Igbe Akwụkwọ Nwere Ụkwụ? Olee ndị ji ya jee ozi? Olee mgbe e ji ya jee ozi, oleekwa ihe e ji ya mee?

Ihe dị n’ebe anyị na-edebe ihe ochie dị ka ihe dị n’ọ́bọ́ foto ezinụlọ. N’ebe ahụ, e nwere akụkọ banyere anyị na akụkọ banyere ndị bu anyị ụzọ rụọ ọrụ a. A kọrọ banyere okwukwe na obi ike ha ji jeere Jehova ozi, kọọ banyere ihe ndị nyere ha ọṅụ na ihe ndị siiri ha ike n’ozi ha jeere Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, kọọkwa otú Chineke si na-eduzi ndị ya ma na-enyere ha aka mgbe niile. (Diut. 33:27) Obi siri anyị ike na Jehova ga na-agọzi mbọ anyị na-agba idozi akụkọ banyere ihe ndị mewere n’ọgbakọ a kemgbe bụ́ nke ga-eme ka anyị dịrịkwuo n’otu, meekwa ka anyị nọsie ike na-eme uche ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Ka Anyị Lebakwuo Anya na Ngalaba Ahụ

Mgbe a na-akwadebe akwụkwọ anyị, diiviidi, na ihe ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl, ndị na-edere anyị ihe, ndị na-esere anyị ihe, ndị na-emere anyị nchọnchọ, na ndị ọzọ, na-aga n’ebe ndị anyị na-edebe ihe ochie. N’ihi nke a, ndị na-arụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie na-agbalịsi ike ịhụ na ha wekọtara ihe ndị anyị ji mee ihe n’oge gara aga ma dozie ha. Ha bụ ihe ndị anyị wetara n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche, ná ngalaba ndị dị na Betel, n’ọgbakọ, nakwa ihe ndị anyị natara ndị mmadụ na ụlọ ọrụ dị iche iche. Ka anyị tụlee otú ha si eme nke a:

Inweta Ihe Ndị Dị Mkpa na Inyocha Ha: A na-achịkọta ihe ndị dị ezigbo mkpa ma tinye ha n’ebe anyị na-edebe ihe ochie. Ọtụtụ n’ime ihe ndị a bụ ihe ndị ndị ezinụlọ ha jeerela Jehova ozi ọtụtụ iri afọ nyere anyị ma ọ bụ ndị ha gbazinyere anyị. Inyocha ihe ndị a na iji otu n’ime ha atụnyere ibe ya na-eme ka anyị ghọtakwuo otú ihe si gaa n’ọgbakọ a n’oge gara aga na ndị nọ ya mgbe ahụ.

Ịhazi Ha n’Usoro: E nwere ọtụtụ puku ihe ndị dị ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a anọọla karịa otu narị afọ. E nwere ndị dị obere, nwee ndị buru ibu, e nwekwara ha n’ụdị dị iche iche. A na-eji nlezianya ahazi ihe ndị a n’usoro ka e nwee ike iji ha rụọ ọrụ n’ọdịnihu.

Imezi Ndị Mebiri Emebi na Idozi Ha: A na-emezi akwụkwọ na ihe ndị ọzọ mebiri emebi ma dozie ha nke ọma otú ndị ọkachamara si eme ya. A na-etinye akwụkwọ ụfọdụ, foto, akụkọ, fim, na ihe ndị dị na teepụ na kọmputa. Nke a na-eme ka ọ dị mfe inweta ndị nke a ga-eji rụọ ọrụ n’akpaghị ndị nke ezigbo ha aka.

Idowe Ha Ebe Ha Kwesịrị Ịdị na Ịchọta Ha: A na-edozi ihe ndị a nke ọma ka ha ghara ifu, nakwa ka anwụ ma ọ bụ mmiri ghara imebi ha. A na-ahazi ihe ndị a dị ezigbo mkpa otú ha ga-adị mfe nchọta mgbe ọ bụla a na-eme nchọnchọ nakwa mgbe a chọrọ iji ha rụọ ọrụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

1. Akwụkwọ e ji kpọsaa fim bụ́ “Photo-Drama of Creation.” 2. Akwụkwọ e ji detuo ọda ndị a tụrụ. 3. Ụgbọala a rụnyere ígwè okwu. 4. Ihu Ụlọ Nche April 15, 1912. 5. Akwụkwọ e ji dekọọ ihe banyere J. F. Rutherford mgbe a tụrụ ya mkpọrọ. 6. Maịkrofon e ji arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio bụ́ WBBR. 7. Ígwè fonograf. 8. Igbe e ji ebu akwụkwọ. 9. Ihe mmadụ deturu. 10. Ozi e zigaara J. F. Rutherford.