Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-eme Ka A Zọpụta Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-eme Ka A Zọpụta Mmadụ?

Ọ̀ Bụ Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-eme Ka A Zọpụta Mmadụ?

AJỤỌ gị, sị, “À mụọla gị ọzọ?” gịnị ka ị ga-aza? A jụọ ya ọtụtụ ndị kweere na Kraịst gburugburu ụwa, ha ga-asị, “Eenụ!” Ha kweere na ihe e ji amata ezigbo Ndị Kraịst niile bụ na a ga-amụ ha ọzọ, nakwa na ọ bụ naanị ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka a zọpụta ya. Ha kwenyeere ndị ndú okpukpe, nke otu n’ime ha, bụ́ ọkà mmụta okpukpe a na-akpọ Robert C. Sproul, dere, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, . . . ọ bụghị Onye Kraịst.”

Ì so ná ndị kweere na ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka a zọpụta mmadụ? Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na i kwesịrị inyere ndị ikwu gị na ndị enyi gị aka ka a mụọ ha ọzọ, ka nzọpụta ruo ha aka. Ma, ihe dịgodị ha mkpa bụ ịghọta ọdịiche dị n’onye a mụrụ ọzọ na onye a na-amụbeghị ọzọ. Olee otú ị ga-esi akọwara ha ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara?

Ọtụtụ ndị kweere na ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ pụtara mmadụ ikwe nkwa ijere Chineke na Kraịst ozi, bụ́ nke ga-eme ka onye ahụ, bụ́ onye nwụrụ anwụ n’ime mmụọ, gbanwee ghọọ onye dị ndụ n’ime mmụọ.

Ọ̀ ga-eju gị anya ma a gwa gị na ihe ahụ ọtụtụ ndị kweere adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru? Ị̀ ga-achọ ịmara ihe Okwu Chineke na-akụzi n’ezie banyere ịmụ mmadụ ọzọ? O doro anya na ị ga-erite uru ma ọ bụrụ na i leba anya nke ọma n’isiokwu a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ịghọta ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara n’ezie ga-emetụta ndụ gị, metụtakwa ihe ị na-atụ anya ya n’ọdịnihu.

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?

Otu n’ime ebe ụfọdụ ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ pụtara na Baịbụl bụ Jọn 3:1-12, bụ́ ebe kọrọ banyere ụka na-emetụ n’ahụ́ Jizọs na otu onye ndú okpukpe na Jeruselem kparịtara. E dechara ihe amaokwu ndị ahụ kwuru n’igbe dị n’isiokwu a. Anyị na-agba gị ume ka ị gụọ ya nke ọma.

N’ebe ahụ, Jizọs kwuru ihe dị iche iche banyere ‘ịmụ mmadụ ọzọ.’ * N’eziokwu, ihe Jizọs kwuru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ise a dị mkpa:

Olee otú ịmụ mmadụ ọzọ dịruru ná mkpa?

▪ Ọ̀ bụ anyị ga-ekpebi ma a ga-amụ anyị ọzọ?

▪ Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ?

▪ Olee otú e si amụ mmadụ ọzọ?

▪ Olee mgbanwe a na-enwe ma a mụọ mmadụ ọzọ?

Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a n’otu n’otu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Okwu bụ́ ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ dịkwa na 1 Pita 1:3, 23. O si n’okwu Grik bụ́ gen·naʹo.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

“A Ghaghị Ịmụ Unu Ọzọ”

“E nwere otu nwoke n’ime ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs. Ọ bụ otu n’ime ndị na-achị ndị Juu. Onye a bịakwutere ya n’abalị, sị ya: ‘Rabaị, anyị maara na ị bụ onye ozizi nke si n’ebe Chineke nọ bịa; n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a ị na-eme ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.’ Jizọs zara ya, sị: ‘N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.’ Nikọdimọs sịrị ya: ‘Olee otú a pụrụ isi mụọ mmadụ mgbe o mere agadi? Ọ̀ pụrụ ịbanye n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya?’ Jizọs zara, sị: ‘N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke. Ihe a mụrụ site n’anụ ahụ́ bụ anụ ahụ́, ihe a mụkwara site na mmụọ nsọ bụ mmụọ. Ya ejula gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ. Ifufe na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya, ma ị dịghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-eje. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla a mụrụ site na mmụọ nsọ.’ Nikọdimọs wee sị ya: ‘Olee otú ihe ndị a pụrụ isi mee?’ Jizọs zara ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye nkụzi n’Izrel ma ị maghị ihe ndị a? N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ihe anyị maara ka anyị na-ekwu, ihe anyị hụkwara ka anyị na-agba àmà ya, ma unu adịghị anabata àmà anyị na-agba. Ọ bụrụ na m gwara unu ihe nke ụwa ma unu ekwetaghị, olee otú unu ga-esi kwere ma ọ bụrụ na mụ agwa unu ihe nke eluigwe?’”—Jọn 3:1-12.