Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ A Na-achọ Nduzi Bara Uru

Ọchịchọ A Na-achọ Nduzi Bara Uru

Ọchịchọ A Na-achọ Nduzi Bara Uru

Ọ BỤRỤ na ị chọrọ ndụmọdụ, o juru eju. Ihe ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka so n’ihe ndị kacha aga ahịa n’ụwa. N’ebe dị iche iche n’ụwa, dị ka na Britain, Latin America, Japan, na United States, akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka na-aga ahịa nke ọma. Vidio, nzukọ ọmụmụ ihe, na ihe omume tiivi ndị na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-enyere onwe ha aka amalitekwala iwu ewu. Ihe mere ha ji amasị ndị mmadụ bụ na ha na-akụzi na i nwere ike igboro onwe gị mkpa gị n’agakwurughị onye ọkachamara, onye na-adụ di na nwunye ọdụ, ma ọ bụ onye ụkọchukwu. Gịnị ka ihe ndị a ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka na-akụzi?

Inwe obi ụtọ, otú mmadụ na onye ọ hụrụ n’anya ga-esi dị n’ezigbo mma, na otú e si azụ ụmụ so n’ihe ndị a kacha akụzi na ha. Otú e si emeri ịda mbà n’obi, iru uju, na nsogbu ndị ịgba alụkwaghịm na-akpata sokwa n’ihe ndị a na-ekwukarị na ha. Ndị mmadụ na-achọkarịkwa ndị nke na-ekwu otú e si emeri nsogbu iribiga ihe ókè, ise sịga, na ịṅụbiga mmanya ókè. Ndụmọdụ ndị a na-enweta na ha hà na-aba uru? Mgbe ụfọdụ ha na-aba uru, ma ọtụtụ mgbe, ha anaghị aba. N’ihi ya, anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị atụlee ịdọ aka ná ntị a Baịbụl nyere, nke bụ́: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka dị nnọọ iche n’akwụkwọ ntụziaka ndị nwere ike ịkụziri gị otú e si ese foto, otú e si agbakọ mkpata na mmefu, ma ọ bụ otú e si asụ asụsụ ọzọ. Ịzụ akwụkwọ ntụziaka ndị ahụ nwere ike ịba uru ma dị ọnụ ala karịa ịgawa ihe ọmụmụ pụrụ iche. Akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka adịghị otú ahụ—ma hà na-ekwu banyere achụmnta ego, alụmdi na nwunye, ịzụ ụmụ, ma ọ bụ obi ịdị jụụ. Ha na-akụzikarịrị ndị mmadụ ụzọ pụrụ iche ha ga-esi na-ebi ndụ ma ọ bụ na-eche echiche. N’ihi ya, ọ dị mkpa ịjụ, sị: ‘Ònye na-enye ndụmọdụ ahụ? Olee ebe o si nweta ihe ọ na-ekwu?’

Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ọkachamara na-eji ihe akaebe doro anya n’aka ekwu okwu. Ụfọdụ nwere ike inye ndụmọdụ ha maara na ndị mmadụ ga-akacha anabata, ebe ha maara na ịgwa ndị mmadụ ihe ha chọrọ ịnụ ga-eme ka ha baa ọgaranya. Leenụ, naanị n’otu mba, uru a na-enweta kwa afọ n’akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka karịrị ijeri dọla asatọ!

Akwụkwọ Ndị Mmadụ Ji Enyere Onwe Ha Aka Hà Bachara Uru?

Mgbe i buuru akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka, ị ga-atụ anya inweta ndụmọdụ ga-abara gị uru. Ma mgbe ụfọdụ, ha na-akọwa ihe elu elu. Akwụkwọ ndị dị otú ahụ na-agwakarị gị ihe dị ka nke a: ‘Ọ bụrụ na i kwere na ihe ga-adịrị gị mma, ọ ga-adịrị gị mma. Ị ga-enweta ihe ọ bụla ị chọrọ ná ndụ ma ọ bụrụ na i kwere na ihe ga-adị mma, ma ọ̀ bụ ego, ahụ́ ike, ma ọ̀ bụkwanụ ezi ndị enyi.’ Ụdị ndụmọdụ ahụ ọ̀ na-enye aka? Ọ̀ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ?

Were dị ka ihe atụ akwụkwọ ndị na-ekwu banyere adịm ná mma na alụmdi na nwunye, bụ́ ndị so ná ndị ndị mmadụ kasị azụ. Hà na-enyere ezinụlọ aka ibi n’udo ma nwee obi ụtọ? Ọ bụghị mgbe niile. Otu onye na-enyocha akwụkwọ ndị mmadụ dere kwuru na otu onye dere akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka, bụ́ ndị kwuru banyere ịhụnanya, ndị gakwara nnọọ ahịa na Latin America, “na-akụziri ndị na-agụ akwụkwọ ya otú ha ga-esi mee ka a na-akwanyere ha ùgwù na otú ha ga-esi nwee ezigbo ndị enyi.” O kwuru na mmadụ na onye ihe na-anazighị adabara ya na ya ịnọgide na-akpa bụ onye ahụ imejọ onwe ya. Isi ihe ọ na-ekwu bụ na ihe dị mkpa bụ mmadụ ime ihe ga-eme ya obi ụtọ karịa ịchọpụta ebe ọ na-anaghị emezi emezi ma mezie ya.

N’ezie, akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka nwere ike inye ezi ndụmọdụ mgbe ụfọdụ. Ma, ha nwekwara ike inye mmadụ ndụmọdụ ga-emebiri ya ihe. Onye ọkachamara nwere ike inye ezi ndụmọdụ n’otu ihe ma nye ndụmọdụ ga-eme ka ihe ka njọ n’ihe ọzọ. Ọ gaghị ekwe omume ịtụlecha ọtụtụ ndụmọdụ akwụkwọ ndị ahụ na-enye, bụ́ ndị na-emegidekarị onwe ha. Ònye ka i nwere ike ịtụkwasị ndụmọdụ ya obi? Jụọ onwe gị, sị: ‘È mere nnyocha nke ọma tupu e nye ndụmọdụ ahụ, ka ndụmọdụ ahụ ọ̀ bụ echiche onye dere ya? Ọ̀ ga-abụ na onye dere ya dere ihe ga-eme ka ọ baa ọgaranya ma ghọọ onye a ma ama?’

Otu akwụkwọ nduzi nke baarala ndị mmadụ uru kemgbe ụwa bụ Baịbụl. Ọ na-enye ndụmọdụ ndị bara uru n’ọtụtụ isiokwu akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka na-eleba anya nakwa n’isiokwu ndị ọzọ. Ọ kpaliela ọtụtụ nde mmadụ ịnabata ndụmọdụ bụ́: ‘Meenụ ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ. Yirinụ mmadụ ọhụrụ.’ (Ndị Efesọs 4:23, 24) Baịbụl na-eme ka anyị ghọta ihe ndị na-akpata nsogbu ndị anyị na-enwe ma na-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi merie ha. Nke kacha mkpa bụ na ọ na-agwa anyị ihe ndị mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme ihe ziri ezi. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa otú o si eme nke a.