Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Hà Bụ Ahụhụ Chineke Na-ata Anyị?

Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Hà Bụ Ahụhụ Chineke Na-ata Anyị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Hà Bụ Ahụhụ Chineke Na-ata Anyị?

È nwetụla mgbe i nwere nsogbu gbawara gị obi, gị ajụọ ma Chineke ọ̀ chọrọ ka ị taa ahụhụ? Ọrịa a na-atụghị anya ya, ihe ọghọm nke kwarụrụ mmadụ ma ọ bụ ọnwụ mberede nke onye ezinụlọ anyị, nwere ike mee ka anyị chewe na Chineke chọrọ ịta anyịnwa ahụhụ.

Kama iche otú ahụ, obi ga-eru gị ala ịmara na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ nwee obi ụtọ ma ghara ịta ahụhụ. Ihe mere anyị ji kwere bụ na mgbe Chineke kere nwoke na nwaanyị mbụ, o tinyere ha “n’ogige Iden,” nke bụ́ ubi mara mma ka paradaịs, bụ́ ebe ha ga-anọ n’enweghị nsogbu ọ bụla.—Jenesis 2:15.

Ọ dị mwute na di na nwunye mbụ ahụ jụrụ ihe ọma ahụ Chineke meere ha ma kpachara anya nupụrụ ya isi. Ihe ahụ ha mere kpataara ma hanwa ma anyịnwa ma ụmụ ha ndị ọzọ niile ọdachi. Maka gịnị? E nwere ike iji ihe ahụ merenụ tụnyere ihe nwere ike ime ma nna jụ ịkwụ ụgwọ ụlọ. A ga-achụpụ ezinụlọ ahụ n’ụlọ ha, ha ga-atakwa ahụhụ ya. Otú ahụkwa ka mmadụ niile ji na-ata ahụhụ kemgbe ahụ nwoke na nwaanyị mbụ ahụ nupụrụ isi. (Ndị Rom 5:12) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Job onye ezi omume kwara arịrị na ọ bụrụ na e jiri ‘ihe e ji atụ̀ ihe tụọ’ ahụhụ ya, ọ ga-adị “arọ karịa ájá dị n’oké osimiri.”—Job 6:2, 3.

Ihe ọzọ mere anyị ji ata ahụhụ bụ na anyị amaghị ihe echi ga-abụ. Dị ka ihe atụ, weredị ya na mmadụ wuru ụlọ n’ebe ọkụ na-agbakarị ma resị ya ndị ọzọ. Gị agaa zụrụ otu n’ime ụlọ ndị ahụ biri n’amaghị na ọkụ na-agbakarị n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na ọkụ agbaa ụlọ ahụ, ọ́ gaghị eme ka gị na ezinụlọ gị banye ná nsogbu? Unu banye ná nsogbu n’ihi ya, ọ bụghị Chineke kpatara ya, ka ọ̀ bụ ya? Baịbụl kwuru eziokwu, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Ọ dị mma ịmara na n’agbanyeghị na anyị niile na-ata ahụhụ, Chineke emeela atụmatụ na n’oge na-adịghị anya, ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata ga-akwụsị. Ọ bụrụ na oge ahụ eruo, ị gaghịkwa ata ahụhụ ọzọ, ị gaghịkwa ahụ ma ọ bụ nụ na mmadụ na-ata ahụhụ. Mwute, ihe mgbu, ọnwụ na iru uju, bụ́ ihe ndị na-akpatara anyị anya mmiri, ‘ga-agabiga.’ (Mkpughe 21:4) Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ bụ na Chineke kwere nkwa na ụmụ mmadụ agaghịzi na-ewu ụlọ ma na-akụ mkpụrụ, agha ma ọ bụ ọdachi emebisie ha. Kama, ha ga-eji ihe aka ha rụpụtara “mee ihe n’uju.”—Aịzaya 65:21-25.

Ka ị na-eche ka Chineke kwụsị ahụhụ kpamkpam, gịnị ka ị ga-eme ugbu a ka ị ghara ịna-atacha ahụhụ? Baịbụl kwuru na ihe mbụ ị ga-eme bụ ‘ịghara ịdabere ná nghọta gị,’ kama, ka ‘i jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi.’ (Ilu 3:5) Rịọ ya ka o duzie gị ma kasie gị obi. Jiri amamihe Chineke dị na Baịbụl kpọrọ ihe. Ọ ga-eme ka i mee ezigbo mkpebi, meekwa ka i zere nsogbu ndị ị ga-ezetali.—Ilu 22:3.