Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie Hà Kụziri Ozizi Ndịozi n’Ezie?

Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie Hà Kụziri Ozizi Ndịozi n’Ezie?

Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie Hà Kụziri Ozizi Ndịozi n’Ezie?

A Ọ na-erule ná mbido narị afọ nke abụọ Oge Anyị, ozizi ụgha amalitela ịgwagbu eziokwu Baịbụl Ndị Kraịst na-akụzi. Dị nnọọ ka amụma e si n’ike mmụọ nsọ buo kwuru, mgbe ndịozi nwụsịrị, ụfọdụ ndị hapụrụ eziokwu ma gewe “akụkọ ụgha.” (2 Timoti 4:3, 4) Ihe dị ka n’afọ 98 Oge Anyị, Jọn, bụ́ naanị onyeozi fọrọ ndụ, dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ozizi ụgha ndị dị otú ahụ nakwa banyere ndị “na-agbalị iduhie” Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi.—1 Jọn 2:26; 4:1, 6.

N’oge na-adịghị anya, a bịara nwee ndị e mesịrị kpọwa Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie. Olee ihe ha mere n’oge ahụ e ji ozizi okpukpe na-eduhie ndị mmadụ? Hà ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jọn onyeozi si n’ike mmụọ nsọ nye?

Olee Ndị Ha Bụ?

Ndị a na-akpọ “Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie” bụ ndị na-ede ihe banyere okpukpe bụ́ ndị ọ ga-abụ na ha maara otu n’ime ndịozi Jizọs ma ọ bụ ya abụrụ na ndị ndịozi kụziiri ihe ziri ha ihe. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ikom a dịrị ndụ malite ná ngwụsị narị afọ mbụ Oge Anyị ruo n’etiti narị afọ nke abụọ. * Ụfọdụ n’ime ha bụ Clement nke Rom, Ignatius nke Antiọk, Papias nke Haịrapọlis, na Polycarp nke Smeana. N’otu oge ahụ, e nwekwara ndị ọzọ a na-amaghị aha ha dere akwụkwọ ndị a na-akpọ The Didache, Epistle of Barnabas, Martyrdom of Polycarp, na akwụkwọ ozi nke abụọ nke Clement.

Taa, o siri ike ikwu otú ozizi Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie yiruru nke Jizọs. O doro anya na e nwere ụdị Iso Ụzọ Kraịst ndị ikom a bu n’obi ịkwado ma ọ bụ ịhụ na ọ dịgidere. Ha katọrọ ikpere arụsị na ibi ndụ rụrụ arụ. Ha kweere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke nakwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ. Ma, ha akwụsịlighị ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ezi, bụ́ ndị nọ na-agbasa ebe niile n’oge ahụ. Kama nke ahụ, ụfọdụ n’ime ha so mee ka ha gbasakwuo.

Ọ̀ Bụ na Ihe Ndị Ha Gbanwere Adịghị Mkpa?

Ozizi ụfọdụ nke ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst n’oge gboo dị iche n’ozizi Kraịst na ndịozi ya. Dị ka ihe atụ, onye dere akwụkwọ bụ́ The Didache gwara ndị mmadụ ka ha na-ebu ụzọ ebugharị mmanya tupu e bugharịa achịcha ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Nri Anyasị Ikpeazụ, bụ́ nke dị iche n’ihe Jizọs mere n’oge ọ malitere ya. (Matiu 26:26, 27) Onye dere akwụkwọ a kwukwara na ọ bụrụ na a hụghị mmiri buru ibu a ga-emikpu mmadụ mgbe a na-eme ya baptizim, ịwụsa ya mmiri n’isi ezuola. (Mak 1:9, 10; Ọrụ 8:36, 38) Otu akwụkwọ ahụ gbara Ndị Kraịst ume ịgbaso iwu ibu ọnụ ugboro abụọ kwa izu na ikpe ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ugboro atọ n’ụbọchị.—Matiu 6:5-13; Luk 18:12.

Ignatius kụziri na e kwesịrị inwe ụdị nzukọ Ndị Kraịst dị iche, bụ́ nke ga-enwe naanị otu bishọp “ga-anọchi anya Chineke.” Bishọp a ga-enwe ọtụtụ ndị ụkọchukwu ga-anọ n’okpuru ya. Ụdị ozizi ọhụrụ ndị ahụ mere ka e nwekwuo ọtụtụ ozizi ndị na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ.—Matiu 23:8, 9.

Itinye Nnu na Ose n’Ozizi Ndị Kraịst, Ịnwụ Maka Okwukwe, na Ikpere Arụsị

Ụfọdụ Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie tinyere nnu na ose n’ozizi Ndị Kraịst. Agụụ eziokwu gụrụ Papias, ọ rụtụkwara aka n’ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, o kweere na n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, osisi vaịn ga na-enwe puku alaka iri, alaka nke ọ bụla enwee puku akwụkwọ ọhụrụ iri, akwụkwọ nke ọ bụla enwee puku ụyọkọ mkpụrụ vaịn iri, ụyọkọ nke ọ bụla enwee puku mkpụrụ vaịn iri, mkpụrụ vaịn nke ọ bụla ana-agbapụtakwa ihe ruru otu puku lita mmanya vaịn.

Polycarp dị njikere ịnwụ kama ịhapụ ozizi Ndị Kraịst. E kwuru na ndị kụziiri ya ihe bụ ndịozi na ndị ọzọ maara Jizọs. O kwuru ihe ndị si na Baịbụl, ọ dịkwa ka ọ̀ gbara mbọ iso ụkpụrụ Ndị Kraịst ná ndụ ya.

Ma, ọ fọrọ obere ka ụfọdụ ndị fewe Polycarp ka chi. Akwụkwọ bụ́ Martyrdom of Polycarp kwuru na mgbe Polycarp nwụrụ, “ndị kwere ekwe” chọsiri ike ka e bunye ha ozu ya. Ha kweere na ọkpụkpụ ya “dị oké ọnụ ahịa karịa ọla mara oké mma ma na-egbuke egbuke karịa ọlaedo.” O doro anya na ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ ejula ebe niile.

Ihe Odide Ndị Na-adịghị na Baịbụl

Ụfọdụ Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie nabatara akwụkwọ ndị na-adịghị na Baịbụl ka à ga-asị na e si n’ike mmụọ nsọ dee ha. Otu n’ime ha, bụ́ Clement nke Rom, kwuru ihe ndị e dere n’akwụkwọ abụọ dị otú ahụ bụ́ Wisdom na Judith. Onye dere akwụkwọ bụ́ The Epistle of Polycarp kwuru banyere Tobit iji gosi na ịrụ ọrụ ebere nwere ike ime ka onye na-arụ ya zere ọnwụ.

Na narị afọ nke abụọ Oge Anyị, akwụkwọ ụgha dị iche iche kọrọ akụkọ ndị na-adịghị na Baịbụl banyere Jizọs, Ndị Nna ndị ahụ wekwaara akwụkwọ ndị ahụ dị ka eziokwu. Dị ka ihe atụ, Ignatius kwuru ihe e dere n’akwụkwọ a kpọrọ Gospel of the Hebrews. Otu akwụkwọ kwuru banyere Clement nke Rom, sị: “O yiri ka Clement ọ̀ matara Kraịst site n’ịgụ akwụkwọ ndị na-esoghị na Baịbụl, ọ bụghị site n’ịgụ Oziọma ndị dị na Baịbụl.”

Ọtụtụ Ozizi Ụgha

Ndị ikom a so kpata ọtụtụ ozizi ụgha n’ihi na ha ji akụkọ ụgha, ihe omimi dị iche iche, na nkà ihe ọmụma kọwaa ozizi Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Clement kwuru banyere nnụnụ phoenix iji kwado ozizi mbilite n’ọnwụ. E kwuru na nnụnụ a a kọrọ n’akụkọ ifo si n’ebe ọkụ rere ya, ya aghọọ ntụ, bilie. Akụkọ ifo ndị Ijipt kwukwara na e nwere ihe jikọrọ ya na ofufe anyanwụ.

Onye edemede ọzọ nke lelịrị eziokwu Akwụkwọ Nsọ bụ onye dere akwụkwọ bụ́ Epistle of Barnabas. Ọ kọwara Iwu Mozis ka à ga-asị na ọ bụ akụkọ na-emeghị eme e ji kụzie ihe. O kwuru na anụmanụ ndị dị ọcha, ndị na-atagharị ọnụ, ndị ụkwụ ha wara njakpa (nwere mkpịwa), nọchiri anya ndị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke. Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru na anụmanụ ndị ahụ ụkwụ ha wara njakpa nọchiri anya ndị ezi omume “na-ejegharị n’ụwa a” ma na-atụkwa anya ịdị ndụ n’eluigwe. Nkọwa ndị dị otú ahụ esighị n’Akwụkwọ Nsọ.—Levitikọs 11:1-3.

Àmà Jọn Onyeozi Gbara

Na narị afọ mbụ, Jọn onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu dum si n’aka mmụọ, kama nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyewo n’ime ụwa.” (1 Jọn 4:1) Okwu ndị ahụ dabara nnọọ adaba n’oge ahụ!

Ka ọ na-erule ọgwụgwụ narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ahapụlarị ozizi Jizọs na ndịozi ya. Kama ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie ahụ ịkwụsị ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, ha mere ka ọ gbasakwuo. Ha ji ozizi ụgha gwagbuo eziokwu. Jọn onyeozi gwara ndị dị otú ahụ, sị: “Onye ọ bụla nke na-agabiga ozizi nke Kraịst, nke na-adịghị anọgidekwa na ya enweghị Chineke.” (2 Jọn 9) Ndụmọdụ a si n’ike mmụọ nsọ doro nnọọ ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ anya, ma n’oge ochie ma n’oge a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndị edemede, ndị ọkà mmụta okpukpe, na ndị ọkà ihe ọmụma a na-akpọkarị Ndị Nna Chọọchị dịrị ndụ n’agbata narị afọ nke abụọ na nke ise Oge Anyị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Ụfọdụ Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie, ma Clement, dere banyere akụkọ ifo, ihe omimi dị iche iche, na nkà ihe ọmụma n’ihe odide ha

[Foto dị na peeji nke 28]

Polycarp dị njikere ịnwụ maka ihe o kweere

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Granger Collection, New York