Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịhụ Ibe Ha n’Anya

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịhụ Ibe Ha n’Anya

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịhụ Ibe Ha n’Anya

BAỊBỤL kwuru, sị: “Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya.” (1 Jọn 4:8, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) N’ihi ya, ezi okpukpe kwesịrị ịkụziri ndị òtù ya ịhụ ibe ha n’anya.

E nwere ọtụtụ okpukpe na-eme nnọọ nke ọma n’ilekọta ndị ọrịa, ndị agadi na ndị ogbenye. Ha na-agba ndị òtù ha ume irubere ndụmọdụ Jọn onyeozi nyere isi, nke bụ́: “Ọ bụrụ na otu nwanna n’ime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya n’ebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị n’ime onye dị otú a? Ndị m hụrụ n’anya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị n’ebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị n’egbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site n’okwu ọnụ anyị na omume anyị.”—1 Jọn 3:17, 18, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Oleekwanụ maka n’oge agha? È kwesịrị irubere iwu Chineke bụ́ na ị “ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị” isi n’oge udo ma hapụtụ ya mgbe onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ eze kpebiri ịlụso mba ha na ya gbara agbata obi agha?—Matiu 22:39, Bible Nsọ nke Union Version.

Jizọs kwuru, sị: “Hụrịtaanụ onwe unu n’anya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:35, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ka ị na-aza ajụjụ ndị a ga-ajụ ugbu a, jụọ onwe gị, sị, ‘Ndị okpukpe a hà na-ahụ ibe ha n’anya n’oge niile, na-eme ya n’omume, n’abụghị naanị ikwu ya n’ọnụ?’

ISIOKWU: Agha.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Ana m agwa ụnụ . . . hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, meerenụ ndị kpọrọ ụnụ asị iheọma.”—Luk 6:27, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Mgbe ndị agha bịara ijide Jizọs, Pita onyeozi mịpụtara mma agha iji chebe ya. Ma, Jizọs gwara ya, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Matiu 26:52, Bible Nsọ nke Union Version.

Jọn onyeozi dere, sị: “N’ụzọ dị otú a ka a ga-esi chọpụta ndị bụ́ ụmụ Chineke na ndị bụ́ ụmụ Ekwensu. Onye ọbụla na-anaghị eme iheọma mọbụ hụ nwanne ya n’anya, abụghị onye nke Chukwu. Nke a bụ ozi nke ụnụ nụrụ site ná mbido, na anyị ga-ahụrịta onwe anyị n’anya. Anyị agaghị adị ka Ken, onye bụụrụ onye nke ajọ onye ahụ, ma gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-agwa ndị òtù ya ka ha soro lụọ agha?

ISIOKWU: Ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Mgbe ụfọdụ ndị hụrụ na Jizọs nwere ike ịrụ ọrụ ebube, ha chọrọ ka o soro na ndọrọ ọchịchị obodo ha. Olee ihe o mere? “Jisọs matara ihe ha chọrọ ime. Ọ maara na ha chọrọ ijide ya mee ya eze ha n’ike. Ọ hapụrụ ha gamie n’elu ugwu ahụ nanị ya.”—Jọn 6:15, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Mgbe e jidere Jizọs ma bo ya ebubo na ọ na-emegide ndị ọchịchị, ọ zara, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.”—Jọn 18:36, Bible Nsọ nke Union Version.

Mgbe Jizọs na-ekpegara Chineke ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, o kwuru, sị: “Agwara m ha okwu gị, ụwa wee kpọọ ha asị, n’ihina ha abụghị ndị nke ụwa dịka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa.”—Jọn 17:14, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-eso ihe nlereanya Jizọs ma ghara ịna-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ya bụrụgodị na ọ ga-eme ka ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpọọ ndị òtù ya asị?

ISIOKWU: Ịkpọasị.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Mgbe ndị Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù ghọrọ Ndị Kraịst, Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị ndị Juu ka Chineke na-anabata. Kama n’ime obodo ọ bụla, ndị ọ bụla na-akpọ isi ala nye ya, na ndị na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.”—Ọrụ 10:34, 35, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Mgbe Jems na-edegara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, o kwuru, sị: “Ụmụnna m, unu enwela okwukwe nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Onye nwe ebube, n’ile mmadụ anya n’ihu. N’ihi na a sị na otu nwoke nke yiri mgbaaka ọlaedo na uwe mara mma nke ukwuu bata ná nzukọ unu, ma a sị na otu ogbenye nke yiri uwe ruru unyi batakwa; ọ bụrụkwa na unu elee onye ahụ nke na-eyi uwe mara mma nke ukwuu anya, sị, Gị onwe gị nọdụ ala n’ebe a nke ọma; unu wee sị ogbenye ahụ, Gị onwe gị guzo n’ebe a, ma ọ bụ nọdụ ala n’okpuru ihe mgbakwasị ụkwụ m; ùnu enweghị obi abụọ n’ime onwe unu, ùnu aghọghịkwa ndị ikpe na-eche echiche ọjọọ?—Jems 2:1-4, Bible Nsọ nke Union Version.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-akụzi na mmadụ niile ha nhata n’anya Chineke nakwa na ndị òtù ya ekwesịghị ileda onye ọ bụla anya n’ihi agbụrụ o si ma ọ bụ n’ihi na ọ dara ogbenye?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

Olee okpukpe na-akụziri ndị òtù ya izere nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agbụrụ, na akụnụba na-akpata n’etiti ụmụ mmadụ?