Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eze Devid na Abụ

Eze Devid na Abụ

Eze Devid na Abụ

Ọ BỤRỤ na e nwere onye ọ na-abụ a kpọọ aha ya, e cheta abụ ndị a bụrụ n’oge Baịbụl, ọ bụ Devid, bụ́ nwoke nwere nkà pụrụ iche nke dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ atọ gara aga. N’eziokwu, ọtụtụ ihe anyị maara taa banyere ịbụ abụ n’oge ochie si n’ihe e dere na Baịbụl banyere ihe ndị Devid mere, malite n’oge ọ bụ nwata na-azụ atụrụ ruo mgbe ọ ghọrọ eze na ọkà n’ịhazi ihe.

E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid banyere abụ ndị a bụrụ n’oge Baịbụl. Dị ka ihe atụ, olee ụdị ngwá egwú e ji bụọ abụ n’oge ahụ, oleekwa ụdị abụ ndị a bụrụ? Olee otú abụ dịruru mkpa ná ndụ Devid, oleekwa otú ọ dịruru mkpa ná mba Izrel?

Uru Abụ Baara Ndị Izrel Oge Ochie

Ịgụpụta okwu abụ agụpụta na-emekarị ka mmadụ cheta ụda egwú ya na ya so. E nwere okwu nke ọtụtụ abụ na Baịbụl, ma ọ dị mwute na ọ dịghị onye maara otú e si bụọ ha. Ọ ga-abụrịrị na ha tọrọ ụtọ, bụrụdị ịgba. Otú okwu ndị dị n’akwụkwọ Abụ Ọma si maa mma na-egosi na abụ ndị e ji ha bụọ tọkwara ezigbo ụtọ.

O nweghị oké ihe Baịbụl kwuru banyere ngwá egwú. (Gụọ igbe bụ́  “Ngwá Egwú Ndị E Nwere n’Oge Baịbụl.”) O nweghịdị onye ji n’aka ụdị ụbọ akwara Devid ji bụọ abụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị mma ịmara na ndị Izrel mepụtara ụdị ngwá egwú dị iche iche, dị ka ụdị ụbọ akwara e ji osisi rụọ, bụ́ ndị dị oké ọnụ ahịa ma sie ike nnweta.—2 Ihe E Mere 9:11; Emọs 6:5.

Ma, otu ihe doro anya. Abụ dị mkpa ná ndụ ndị Hibru, karịchaa n’ofufe ha na-efe Chineke. A na-abụ abụ mgbe a na-echi ndị mmadụ echichi, na-abụ ya n’ememme okpukpe, na-abụkwa ya n’oge agha. Ọ na-emekwa ndị nọ n’obí eze obi ụtọ, na-eme ka agbamakwụkwọ na nnọkọ ezinụlọ kporo ọkụ, na-emekwa ka ememme ịghọ mkpụrụ vaịn na ọka na-atọ ụtọ. Ọ dị mwute na a bụkwara abụ n’ebe ndị a na-anọ eme omume rụrụ arụ. Ọ bụrụkwa na mmadụ anwụọ, a na-eji abụ akasi ndị ọ hapụrụ obi n’uju ha na-eru.

E nwekwara ihe ndị ọzọ e ji abụ mee n’Izrel. E ji ya mee ka uche kpakọọ ndị mmadụ ọnụ, meekwa ka ndị amụma dị njikere ịnụ ihe Chineke chọrọ ịgwa ha. Ọ bụ mgbe a na-akpọ ụbọ akwara ka Ịlaịsha natara ozi n’aka Chineke. (2 Ndị Eze 3:15) E jikwa abụ egosi na oge ememme eruola. A na-afụ opi ọlaọcha abụọ iji maa ọkwa ọnwa ọhụrụ na ememme ndị ọzọ. N’ụbọchị Jubili, a na-afụ opi iji kpọsaara ndị ohu na ha enwerela onwe ha nakwa na oge eruola ka ndị mmadụ nwetaghachi ala na ụlọ ha rere ere. Ọ ga-abụrịrị na obi na-atọ nnọọ ndị ogbenye ụtọ mgbe ha nụrụ abụ na-egosi na oge eruola ka ha nwere onwe ha ma ọ bụ nwetaghachi ihe onwunwe ha!—Levitikọs 25:9; Ọnụ Ọgụgụ 10:10.

Ọ ga-abụrịrị na ụfọdụ n’ime ndị Izrel bụ ọkaibe n’ịgụ egwú ma ọ bụ n’ịbụ abụ. N’ezie, otu ihe ndị Asiria kpụrụ akpụ gosiri na Eze Senakerib gwara Eze Hezekaya ka o nye ya ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ n’ọnọdụ ụtụ ọ na-atụrụ ya. O yiri ka hà bụ ọkaibe n’ịbụ abụ. Ma, Devid kacha ha niile nwee nkà n’ịbụ abụ.

Ọbụ Abụ Nwere Nkà Pụrụ Iche

Devid nwere nkà pụrụ iche ma n’ịbụ abụ ma n’ide abụ. A sịrị na ọ bụ ya dere ihe karịrị ọkara abụ ọma. Mgbe ọ bụ nwata, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ, ihe ndị ọ hụkwara mgbe ọ na-azụ atụrụ na Betlehem juru ya n’isi ebe ọ bụ na ụbụrụ ya na-aghọ nkọ. Obi na-atọ ya ụtọ ịnụ ụda mmiri na-asọ asọ na ịnụ ubé atụrụ ya mgbe ọ kpọrọ ha òkù. Ụda ndị ahụ ọ nọ na-anụ mere ka o jiri ọnụ ya na ụbọ akwara ya bụkuo Chineke abụ otuto. Ọ ga-abụ nnọọ ihe obi ụtọ ịnụ ụda abụ Devid bụrụ nke e dere n’Abụ Ọma nke 23!

Mgbe Devid bụ nwa okorobịa, ọ na-akpọ ụbọ akwara nke ọma nke na a kọọrọ Sọl, bụ́ eze, banyere ya, ya akpọrọ ya. Mgbe ọ bụla obi na-adịghị Sọl mma, isi ana-agba ya ghara ghara, Devid na-abịakwute ya were ụbọ akwara ya kpọọrọ ya abụ dị ụtọ nke na-eme ka isi dajụọ eze ahụ. Echiche ọjọọ na-enye Sọl nsogbu na-akwụsị, ahụ́ eruo ya ala.—1 Samuel 16:16.

Abụ, bụ́ nke na-amasị nnọọ Devid ma na-eme ya obi ụtọ, kpatara nsogbu mgbe ụfọdụ. Otu ụbọchị, mgbe Devid na Sọl si agha ha meriri ndị Filistia na ya na-alọta, eze ahụ nụrụ abụ mmeri na nke obi ụtọ a bụụrụ ha. Ndị inyom nọ na-abụ abụ, sị: “Sọl egbuwo puku kwuru puku, Devid egbuwokwa iri puku kwuru iri puku.” Nke a were Sọl oké iwe, ya emewere Devid anyaụfụ nke na ọ “nọ na-ele Devid anya ọjọọ malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.”—1 Samuel 18:7-9.

Onye Abụ Kpaliri

Abụ ndị Devid si n’ike mmụọ nsọ dee pụrụ nnọọ iche n’ọtụtụ ụzọ. Ọ bụrụ ma abụ ndị na-akpali iche echiche ma ndị na-ekwu banyere ịzụ atụrụ. E nwere ma ndị nke bụ́ abụ otuto ma ndị nke na-akọ akụkọ ihe mere eme, ndị nke na-ekwu banyere ọṅụ a na-enwe n’oge ịghọ mkpụrụ vaịn na ndị nke e ji eme nnukwu ememme e ji emeghe obí eze, ndị nke e ji echeta ihe ndị merela eme na ihe ndị a na-atụ anya ha, nakwa ndị nke e ji arịọ arịrịọ. (Gụọ Abụ Ọma nke 32, 23, 145, 8, 30, 38, 72, 51, 86 na okwu mmeghe ha.) Mgbe Sọl na nwa ya Jọnatan nwụrụ, Devid dere abụ iru uju a kpọrọ “Ụta,” nke o ji okwu ndị a malite: “E gbuwo ịma mma gị, Izrel, n’ebe gị ndị dị elu.” O ji olu ákwá bụọ ya. Devid maara otú o nwere ike isi jiri ma abụ ọ na-ede ede ma nke ọ na-akpọ n’ụbọ akwara gosi otú obi dị ya n’oge dị iche iche.—2 Samuel 1:17-19.

Ebe Devid bụ nwoke dị gara gara, egwú na-atọ ụtọ a na-agba agba na-amasị ya. Mgbe o bubatara igbe ọgbụgba ndụ na Zayọn, ọ wụliri elu ma jiri ike ya niile tegharịa egwú ọṅụ iji gosi obi ụtọ o nwere. Ihe e dere na Baịbụl gosiri na ọ ga-abụrịrị na egwú ahụ na-akpali nnọọ akpali. Jirigodị anya nke uche gị kirie ihe merenụ! Nwunye ya bụ́ Maịkal kparịrị ya n’ihi egwú ahụ o tere. Ma, nke ahụ agbasaghị Devid. Ọ hụrụ Jehova n’anya, ụdị obi ụtọ o nwekwara n’ihi egwú ahụ mere ka ọ wụliwe elu n’ihu Chineke ya.—2 Samuel 6:14, 16, 21.

E wezụga nke ahụ, Devid gosikwara na ya bụ ọkaibe site n’ịrụpụta ngwá egwú ndị ọhụrụ. (2 Ihe E Mere 7:6) O yiri nnọọ ka Devid ò nwere nkà pụrụ iche n’ihe niile a ebe ọ bụ onye na-arụpụta ngwá egwú, onye na-ede abụ, na onye na-agụ ya agụ. Ma, Devid medịrị ihe ndị karịrị nke ahụ.

Ịbụ Abụ na Ịgụ Egwú n’Ụlọ Nsọ Chineke

Otu ihe e ji echeta Devid bụ otú o si hazie ịbụ abụ na ịgụ egwú n’ụlọ Jehova. O mere Esaf, Himan, na Jedutọn (onye ọ ga-abụkwa ya ka a kpọrọ Itan) ndị isi nke puku mmadụ anọ na-abụ abụ ma na-agụ egwú. Devid mere ka ha na narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ, ndị bụ́ ọkà, rụkọọ ọrụ, bụ́ ndị zụrụ ma lekọta ndị ọzọ so n’ìgwè ahụ. Puku mmadụ anọ ahụ na-abụ abụ ma na-agụ egwú na-anọcha n’ụlọ nsọ Chineke mgbe e mere nnukwu ememme atọ a na-eme kwa afọ. Chegodị echiche otú ndị abụ ahụ si dị ebube ma maa mma ile anya!—1 Ihe E Mere 23:5; 25:1, 6, 7.

Ọ bụ naanị ndị ikom na-abụ abụ n’ụlọ nsọ Chineke. Okwu bụ́ “ọ bụ Ụmụ Agbọghọ ga-abụ ya,” nke dị n’okwu mmeghe nke Abụ Ọma nke 46, na-egosi na a na-eji ụda olu ma ọ bụ ngwá egwú na-adasi ụda ike abụ ya. Ha na-eji otu olu abụ abụ n’ihi na 2 Ihe E Mere 5:13 kwuru, sị: “Ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-agụ egwú.” Abụ ndị ahụ nwere ike ịbụ abụ olu ụtọ, dị ka Abụ Ọma nke 3 na ọtụtụ abụ ọma ndị ọzọ Devid dere, mgbe ụfọdụkwa, a na-ekwe ha ekwe, dị ka Abụ Ọma 42:5, 11, na Abụ Ọma 43:5. Abụ ndị ọ na-abụ ụfọdụ bụtụ ibe ha abụtụ na-atọkwa ezigbo ụtọ. Otú ahụ ka ọ dị Abụ Ọma nke 24, bụ́ nke o doro anya na Devid dere mgbe o bubatara igbe ọgbụgba ndụ na Zayọn.—2 Samuel 6:11-17.

Ma, ọ bụghị naanị ndị Livaị na-abụ abụ. Ụmụ Izrel na-abụ abụ mgbe ha na-aga Jeruselem maka ememme ndị ha na-eme kwa afọ. O nwere ike ịbụ ihe “Abụ Nrịgo” pụtara. (Abụ Ọma 120 ruo 134) Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma nke 133, Devid kwuru okwu ọma banyere otú ụmụ Izrel si adị n’otu dị ka ụmụnne n’oge ndị ahụ. Ná mmalite abụ ahụ, o kwuru, sị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!” Chegodị echiche ụdị egwú ya na abụ a ga-eso!

Abụ na Ofufe Jehova

E kee Baịbụl ụzọ iri, ihe e dere n’otu ụzọ bụ ụdị abụ ndị ahụ, akwụkwọ Abụ Ọma na-agbakwa mmadụ niile ume ito Chineke. (Abụ Ọma nke 150) Egwú nwere ikike ime ka mmadụ chefuo ihe ndị na-echegbu ya, ịbụ abụ nwekwara ike ime ka obi dị onye obi tiwara etiwa mma. Ma, Baịbụl kwukwara ka ndị obi dị ụtọ bụọ abụ otuto.—Jems 5:13.

Ịbụ abụ bụ ihe mmadụ nwere ike iji gosi okwukwe na ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ya na ndịozi ya bụrụ abụ mgbe ha richara nri. (Matiu 26:30) Chegodị echiche ụdị olu abụ Nwa Devid ahụ ga-enwe, bụ́ onye maara abụ dị ebube ndị nọ n’ihu Chineke n’eluigwe na-abụ! O yiri ka ọ̀ bụ abụ Hallel, nke dị n’Abụ Ọma 113 ruo 118, ka ha bụrụ. Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na Jizọs na ndịozi ya, bụ́ ndị na-amaghị ihe niile na-aga ime, ji olu dara ụda bụọ, sị: “Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ olu m na arịrịọ m. . . . Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu, anọ m n’ọnọdụ ọjọọ dị ka à ga-asị na m nọ na Shiol. . . . ‘Biko, Jehova, meere mkpụrụ obi m ụzọ mgbapụ!’”—Abụ Ọma 116:1-4.

Ọ bụghị mmadụ chepụtara ịbụ abụ. Baịbụl kwuru banyere ịgụ egwú na ịbụ abụ n’eluigwe, bụ́ ebe ndị bụ́ mmụọ na-akpọ ụbọ akwara ihe atụ ma na-abụ abụ otuto gburugburu ocheeze Jehova. (Mkpughe 5:9; 14:3; 15:2, 3) Ọ bụ Jehova Chineke nyere ụmụ mmadụ onyinye ịbụ abụ, tinye agụụ ịbụ abụ n’obi ha, meekwa ka ọ na-agụ ha nnọọ agụụ iji ngwá egwú ma ọ bụ abụ gosi otú obi dị ha. Abụ bụụrụ nnọọ ndị nwere okwukwe ezigbo onyinye si n’aka Chineke.—Jems 1:17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 27]

“N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ nakwa n’oge ememme unu . . . unu ga-afụ opi.”—ỌNỤ ỌGỤGỤ 10:10

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 28]

“Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m. Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara; ọ na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.”—ABỤ ỌMA 23:1, 2

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]

“E nwere puku mmadụ anọ ndị na-eji ngwá egwú enye Jehova otuto, bụ́ ngwá egwú Devid kwuru banyere ha, sị, ‘Emere m ha maka iji ha na-enye otuto.’”—1 IHE E MERE 23:4, 5

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]

Devid ji abụ ndị o dere ede na ndị ọ gụrụ agụ gosi otú obi dị ya n’oge dị iche iche

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 30]

“Toonụ Jaa! Jirinụ obere ịgbà na egwú a na-ete na-agba gburugburu too ya. Ihe niile na-eku ume, ka ha too Jaa.”—ABỤ ỌMA 150:1, 4, 6

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

 Ngwá Egwú Ndị E Nwere n’Oge Baịbụl

Ihe ndị so n’ụbọ akwara bụ une na ụbọ nwere akwara iri. (Abụ Ọma 92:3) Ha na Alamọt na Sheminit na-adakọ ụda, bụ́ nke nwere ike ịpụta ụda dị elu na ụda dị ala. (1 Ihe E Mere 15:20, 21) Ngwá egwú ndị so ná ndị e ji ọla bras mee na ndị nke a na-afụ afụ bụ ọjà, une, na opi, bụ́ ndị a ‘na-afụsi ike.’ (2 Ihe E Mere 7:6; 1 Samuel 10:5; Abụ Ọma 150:3, 4) Mgbe a na-enyefe Chineke ụlọ nsọ ahụ, ndị na-afụ opi na ndị na-abụ abụ ji “otu olu na-agụ egwú.” (2 Ihe E Mere 5:12, 13) Ọ ga-abụ na nke ahụ pụtara na olu ha niile dakọrọ adakọ, n’enweghị onye olu ya gbapụrụ iche. Ngwá egwú ndị so ná ndị a na-akụ akụ bụ obere ịgbà na sistrọm, bụ́ ụdị ngwá egwú ndị na-ada oké ụda, nakwa “ụdị ngwá egwú niile e ji osisi junipa rụọ.” E nwekwara ájà ndị obere, bụ́ ‘ndị ụda ha na-atọ ụtọ,’ nweekwa ndị nke nnukwu a na-akpọ ‘ájà na-ada ụda.’— 2 Samuel 6:5; Abụ Ọma 150:5.

[Foto]

N’elu: Ihe ndị si n’Ogidi Titus, Rom, Ịtali, ndị na-egosi opi ndị a kwaara n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem n’afọ 70 Oge Anyị. Mkpụrụ ego dịrị n’ihe dị ka afọ 130 Oge Anyị bụ́ ndị na-egosi ngwá egwú ndị Juu

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Mkpụrụ ego: © 2007 nke si n’aka David Hendin. Naanị ya ka ikike ibipụtaghachi ya dị n’aka.