Ì Kwesịrị Ịkwụwa Aka Ọtọ Mgbe Niile?
Ì Kwesịrị Ịkwụwa Aka Ọtọ Mgbe Niile?
ONYE ọ bụla na-akwụwa aka ọtọ mgbe ụfọdụ; ikekwe, ọtụtụ na-akwụwakarị aka ọtọ. Ma, mmadụ ole ka ị maara na-agbalị ịkwụwa aka ọtọ mgbe niile?
N’ọtụtụ ihe a na-eme ná ndụ taa, ndị mmadụ anaghị akwụwa aka ọtọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị maara otú Chineke si ele ịkwụwa aka ọtọ anya. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara iwu nke asatọ n’Iwu Iri ahụ, nke bụ́: “Ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Ma, ọtụtụ ndị chere na ọnọdụ nwere ike ime ka mmadụ zuo ohi mgbe ụfọdụ ma ọ bụ ghara ịkwụwa aka ọtọ n’ụzọ ndị ọzọ. Ka anyị tụlee ụdị izu ohi atọ ndị mmadụ na-ewerekarị na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ha.
Ịda Ogbenye Ò Kwesịrị Ime Ka Mmadụ Zuo Ohi?
Otu onye Rom ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị kwuru otu mgbe, sị: “Ọ bụ ịda ogbenye na-akpata izu ohi.” Onye dara ogbenye nwere ike iche na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụ ma ya zuo ohi. Ndị hụrụ ya nwekwara ike iche otú ahụ. Olee ihe Jizọs kwuru n’okwu a? O meteere nnọọ ndị nọ ná mkpa ebere. “O nwere ọmịiko n’ebe ha nọ.” (Matiu 9:36) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịtụghị mgbe o kwuru na izu ohi dị mma. Oleezi ihe onye dara ogbenye kwesịrị ime?
Chineke nwere ọmịiko n’ebe ndị si n’ala ala obi ha na-agbalị irubere ya isi nọ, ọ ga-agọzikwa mgbalị ha na-eme inweta ihe ndị na-akpa ha. (Abụ Ọma 37:25) Baịbụl kwere nkwa, sị: “Jehova agaghị eme ka agụụ gụọ mkpụrụ obi onye ezi omume, ma ihe na-agụsi ndị ajọ omume ike ka ọ ga-ewepụ.” (Ilu 10:3) Onye ogbenye ò nwere ike ịtụkwasị nkwa a obi? Viktorin kwenyesiri ike ná nkwa a.
Ebe Viktorin bụ nwaanyị di ya nwụrụ nke nwere ụmụaka ise ka nọ n’ụlọ akwụkwọ, ihe adịghịrị ya mfe. O bi n’obodo ka na-emepe emepe bụ́ ebe gọọmenti na-anaghị enyechara ụmụ amaala aka. Ndị mmadụ na-arụ ọrụ ọtụtụ awa n’ebe ọrụ, bụ́ ebe ha nwere ọtụtụ ohere izu ohi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịtụbeghị mgbe izu ohi gbatara Viktorin n’obi. Kama nke ahụ, ọ na-agba mbọ inweta ihe ya na ụmụ ya ga-eri site n’ire akwụkwọ akụkọ n’okporo ámá. Olee ihe mere o ji nọgide na-akwụwa aka ọtọ?
O kwuru, sị: “Nke mbụ, ekweere m na Chineke na-akwụwa aka ọtọ nakwa na ọ ga-emeso m ihe n’ịkwụwa aka ọtọ ma ọ bụrụ na mụ
eṅomie ya. Nke abụọ, ụmụ m nwere ike ịmụta ịkwụwa aka ọtọ naanị ma ọ bụrụ na ha hụrụ na m na-eme otú ahụ.”Olee otú ndụ dịịrị ya? “Anyị nwere ihe oriri, uwe, na ebe obibi. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweela oge ndị m rịọrọ ndị enyi m ka ha nyere m aka, dị ka ihe atụ, iji kwụọ ụgwọ ụlọ ọgwụ m na-atụghị anya ya. M na-enweta ihe dị m mkpa mgbe niile. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị enyi m maara na m gwara ha eziokwu banyere ọnọdụ m nakwa na mụ anaghị anwa inweta ihe karịrị ihe na-akpa m.
“Ụmụ m amụtala ịkwụwa aka ọtọ ka ha na-eto. N’oge na-adịbeghị anya, otu onye agbata obi m hụrụ ụfọdụ mkpụrụ ego n’elu tebụl anyị ma jụọ m ma ọ̀ bụ na ụjọ anaghị atụ m na ụmụ m nwere ike iwere ha. O siiri ya ike ikweta mgbe m gwara ya na ụmụ m enwetụghị ike ime ụdị ihe ahụ. O kpebiri ịnwa ha ọnwụnwa n’agwaghị m. O zooro ezoro dowe mkpụrụ ego abụọ bụ́ otu narị frans n’ime ụlọ anyị n’ebe ụmụ m ga-ahụ ha ngwa ngwa. Mgbe ọ bịara n’echi ya, o juru ya anya ịhụ na mkpụrụ ego ndị ahụ ka dị ebe ahụ. Inwe ụmụ na-akwụwa aka ọtọ bara uru karịa inwe ọtụtụ ihe onwunwe.”
“Onye Ọ Bụla Na-eme Ya”
Ọtụtụ ndị na-ezu ohi n’ebe ọrụ ha. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-eche, sị, ‘Onye ọ bụla na-eme ya, oleezi ihe ga-eme ka m hapụ ime ya?’ Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Esonyela ìgwè mmadụ ịga mee ihe ọjọọ.” (Ọpụpụ 23:2) Viktụwa na-erubere iwu a isi. Ọ̀ baarala ya uru?
Mgbe Viktụwa dị afọ iri na itoolu, ụlọ ọrụ na-asụ nkwụ were ya n’ọrụ. N’oge na-adịghị anya, ọ chọpụtara na iri ụmụ nwaanyị anọ na-arụ ọrụ n’ebe ahụ na-eji nkata ha ezupụ akị n’ụlọ ọrụ ahụ. Ná ngwụsị izu ọ bụla, ha na-ere akị ndị ahụ ma reta ego ruru ụgwọ abalị atọ ma ọ bụ anọ ha. Viktụwa kọrọ, sị: “Onye ọ bụla na-eme ya. Ha tụrụ anya ka m soro ha, ma m jụrụ, gwa ha na m na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile m na-eme ná ndụ. Ha kwara m emo, na-ekwu na ọ bụ m ka ọ ga-aka njọ.
“Otu ụbọchị, mgbe anyị niile kwụ n’ahịrị na-apụ n’ụlọ ọrụ anyị, onyeisi ọrụ anyị pụtara na mberede. O lere ihe dị na nkata onye nke ọ bụla ma hụ akị na nkata mmadụ niile ma e wepụ nke m. A ga-achụ ndị niile a hụrụ akị na nkata ha ozugbo ma ọ bụ ha arụọ ọrụ izu abụọ n’anataghị ụgwọ ọrụ. N’ime izu abụọ ahụ, ụmụ nwaanyị ahụ ghọtara nnọọ na ọ bụghị m ka ọ ka njọ.”
“Ndị Ndozi”
Olee ihe na-agbata gị n’obi mgbe ị hụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa funahụrụ onye ọzọ? Ihe ga-abata ọtụtụ ndị n’obi ozugbo bụ iwere ya, gharakwa iche echiche iweghachi ya. Ha na-asị na ha “na-edozi” ya. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ya. Ha na-eche na a sị ka e kwuwe, onye nwe ya echefuchaala ya. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụghị ọrụ ha ịchọwa onye nwe ihe ahụ—bụ́ nke nwere ike iwe mgbalị dị ukwuu.
Olee otú Chineke si ele okwu a anya? Diuterọnọmi 22:1-3 gosiri na onye hụrụ ihe furu efu ekwesịghị idoziri ya onwe ya kama na o kwesịrị idowe ya “ruo mgbe [onye nwe ya] ga-achọwa ya, ya enyeghachikwa ya ya.” (The New English Bible) Ọ bụrụ na onye chọtara ihe ahụ furu efu ekwughị na ọ dị ihe ya chọtara, e nwere ike ibo ya ohi. (Ọpụpụ 22:9) Nke ahụ ọ̀ ka bara uru taa? Kristin kwenyesiri ike na ọ ka bara.
Kristin bụ onyeisi otu ụlọ akwụkwọ mmadụ nwe. Otu ụbọchị Wenezdee, ọ gara nara ụgwọ ọnwa ya. O mere nnọọ otú ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka na-emekarị, fụkọta ego ahụ faba ya n’ime akpa ya. Ọ kpọtuziri ọkada ma gbara gawa ọmụmụ ihe. Mgbe o rutere, ọ fọnyere aka n’akpa ya iji wepụta mkpụrụ ego ọ ga-eji kwụọ onye ọkada ahụ. Ebe ọ bụ na chi ejiwela, ùkwù ego ahụ dapụrụ n’ala, ọ makwanụghị.
Mgbe nkeji ole na ole gachara, Blez, bụ́ onye
ọbịa n’ebe ahụ nke dị afọ iri na itoolu gafere n’okporo ámá ahụ. Ọ bịara ịhụ otu enyi ya n’otu ọmụmụ ihe ahụ Kristin bịara. Ọ hụrụ ùkwù ego ahụ ma tinye ya n’akpa ya. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ mechiri, ọ gwara enyi ya na ọ dị ihe ya tụtụtara n’èzí nakwa na ọ bụrụ na o nwere onye ihe funahụrụ, onye ahụ nwere ike ịkpọ ya n’ekwe ntị, bịa kọwaa onwe ya ma were ya.Mgbe Kristin ruru ụlọ n’abalị ahụ, akpata oyi wụrụ ya mgbe ọ hụrụ na ụgwọ ọnwa ya efuola. Mgbe otu izu gachara, mgbe ọ gwara enyi ya nwaanyị bụ́ Josefin ihe funahụrụ ya, Josefin gwara ya na ọ dị ihe otu onye ọbịa bịara ọmụmụ ihe ahụ chọtara. Kristin kpọrọ Blez ma kọwaa ụdị akwụkwọ ego ndị dị n’ùkwù ego ahụ. Obi tọgburu ya atọgbu mgbe Blez weghachiiri ya ego ahụ. Oleekwanụ maka Blez? O dowere ego ahụ ruo otu izu, ma o kwuru, sị, “Ọṅụ m nwere n’iweghachi ego ahụ karịrị nke m gaara enwe ma a sị na m weere ya.”
Ihe Mere Ha Ji Agba Mbọ Ịkwụwa Aka Ọtọ Mgbe Niile
Viktorin, Viktụwa, na Blez ebighị otu ebe, ha amaghịkwa ibe ha. Ma, ọ dị otu ihe jikọtara ha. Ha bụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-agbaso ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwụwa aka ọtọ. Ha na-atụ anya mmezu nke nkwa Chineke kwere iweta ụwa ọhụrụ. “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” Ndị niile ga-adị ndụ mgbe ahụ ga-abụ ndị ezi omume—na-akwụwakwa aka ọtọ.—2 Pita 3:13.
Viktorin enwechaghị olileanya na ọ ga-enwetawakwu nnukwu ego karịa ka ọ na-enweta ugbu a ruo mgbe Chineke ga-agbanwe ihe niile. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ihe ego na-agaghị azụtali. Ụmụ ya na-akwụwa aka ọtọ ma na-akpa ezi àgwà. Kwa Sọnde, ha ‘na-ekwu okwu nke ukwuu’ mgbe ha na-agwa ndị agbata obi ha banyere ịdị mma Chineke ma na-akọwara ha otú Chineke ga-esi nyejuo “ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu” afọ ma chee “ndị niile hụrụ ya n’anya” nche.—Abụ Ọma 145:7, 18, 20.
Ka oge na-aga, Viktụwa hapụrụ ụlọ ọrụ ahụ na-asụ nkwụ. Ọ malitere azụmahịa nke ya ma malite ire garị n’ahịa. Ịkwụwa aka ọtọ ya masịrị ndị na-azụ ya ahịa. N’ezie, n’oge na-adịghị anya, o gbubilatara oge ọ na-eji anọ n’ahịa ma tinyekwuo oge n’ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya nke ibi n’ụwa ebe mmadụ niile ga na-akwụwa aka ọtọ. O mechara lụọ di, ya na di ya na-ekwusakwa ozi ọma oge niile ugbu a.
Ọ bụ n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ka ego Kristin dapụnahụrụ ya. Blez amachaghị ndị bịara ọmụmụ ihe ahụ, ma ọ maara na ha bụ ụmụnna ya Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agba mbọ ịkwụwa aka ọtọ mgbe niile.
Mmadụ ole ka ị maara na-esi n’ala ala obi ha agbalị ịkwụwa aka ọtọ mgbe niile? Chetụgodị echiche otú ọ ga-adị gị ịnọ n’etiti iri mmadụ ise, otu narị mmadụ, ma ọ bụ narị mmadụ abụọ na-eme otú ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adị Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gaa ebe ahụ ma mata ụdị ndị ha bụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
“Inwe ụmụ na-akwụwa aka ọtọ bara uru karịa inwe ọtụtụ ihe onwunwe.”—VIKTORIN
[Igbe dị na peeji nke 14]
Ilu 6:30 Ọ̀ Na-egosi na Izu Ohi Adịghị Njọ?
Ilu 6:30 na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuru ohi iji mee ka afọ ju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya.” Ihe a e kwuru ebe a ọ̀ na-egosi na izu ohi adịghị njọ? Mbanụ. Ihe a na-ekwu ebe ahụ gosiri na Chineke ka ga-ata onye ahụ ahụhụ maka mmehie ya. Amaokwu sochiri ya kwuru, sị: “Ma mgbe e jidere ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu asaa; ihe niile dị n’ụlọ ya ka ọ ga-enye.” (Ilu 6:31) Ọ bụ ezie na a gaghị ata onye ohi zuru ohi n’ihi agụụ ahụhụ otú a ga-ata onye nke zuru ohi n’ihi anyaukwu ma ọ bụ iji merụọ onye o zuru ihe ya ahụ́, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka “ga-akwụ ụgwọ ya.” Ndị chọrọ ime ihe dị Chineke mma ekwesịghị izu ohi n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya.