Ì Nwere Ike Ịmata Aha Chineke?
Ì Nwere Ike Ịmata Aha Chineke?
Onye nọ n’ọkwá dị elu ịgwa gị ka ị na-akpọ ya aha ya ma i kelewe ya ma ọ bụ gwawa ya okwu bụ ihe ùgwù. A na-etukarị ndị a ma ama aha ndị dị ka “Onyeisi Ala,” “Igwe,” ma ọ bụ “Nna Anyị Ukwu.” Ya mere, o doro anya na ọ bụ ihe ùgwù ma ọ bụrụ na onye nọ n’ọkwá dị elu agwa gị, sị, “Biko, na-akpọ m aha m.”
EZI Chineke gwara anyị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Ọ bụ ezie na o nwekwara ọtụtụ utu aha, dị ka “Onye Okike,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” na “Ọkaakaa Onyenwe anyị,” kemgbe ụwa, ọ na-akwanyere ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe ùgwù site n’ikwe ka ha na-akpọ ya aha ya.
Dị ka ihe atụ, ọ dị mgbe Mozis onye amụma malitere ịrịọ Chineke arịrịọ site n’ikwu, sị: “Biko, Jehova.” (Ọpụpụ 4:10) Mgbe a na-arara ụlọ nsọ Jeruselem nye Chineke, okwu Eze Sọlọmọn ji malite ekpere ya bụ: “Jehova.” (1 Ndị Eze 8:22, 23) Mgbe Aịzaya onye amụma gwakwara Chineke okwu n’aha ndị Izrel, o kwuru, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị.” (Aịzaya 63:16) O doro anya na Nna anyị nke eluigwe na-agba anyị ume ịkpọ ya aha ya.
Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ịkpọ Jehova aha ya, ịma aha ya n’ezie gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Jehova kwere nkwa banyere onye hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi, sị: “M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.” (Abụ Ọma 91:14) O doro anya na ịmara aha Chineke ga-agụnyerịrị ọtụtụ ihe ebe ọ bụ na ọ bụ isi ihe ga-eme ka Chineke chebe anyị. Oleezi ihe a ga-achọ gị n’aka iji mata aha Jehova?