Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA KPARỊTARA

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?

N’ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Anthony gara n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Tim.

MMADỤ IKWERE NA JIZỌS DỊ EZIGBO MKPA

Anthony: Tim, ndeewo. Obi dị m ụtọ ịhụ gị ọzọ.

Tim: Nnọọ. Obi dịkwa m ụtọ ịhụ gị.

Anthony: M weteere gị Ụlọ Nche na Teta! ọhụrụ anyị bipụtara. Ama m na isiokwu ndị gbara na ha ga-atọ gị ụtọ.

Tim: I meela. Obi dị m ụtọ na ị bịara taa n’ihi na e nwere ihe m chọrọ ịjụ gị.

Anthony: Ọ dị mma. Olee ihe ọ bụ?

Tim: E nwere ụbọchị onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ na-ekwurịta okwu, mụ asị ya na e nwere akwụkwọ dị ezigbo ụtọ i nyere m. Ma, ọ gwara m na mụ ekwesịghị ịgụ ya n’ihi na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs. Ọ̀ bụ eziokwu na unu ekweghị na Jizọs? M gwara ya na m ga-ajụ gị ya ụbọchị ọzọ ị bịara.

Anthony: Obi dị m ụtọ na ị jụrụ m. Otú a ị jụrụ Onyeàmà Jehova dị mma karịa ịjụ onye ọzọ. Ị manụ na o nweghị otú ka mma mmadụ ga-esi amata ihe onye ọzọ kweere ma ọ́ bụghị ịjụ onye ahụ.

Tim: Ọọ ya.

Anthony: Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs. Anyị kwedịịrị na mmadụ ga-enwerịrị okwukwe na Jizọs tupu a zọpụta ya.

Tim: M ma na i kweere na Jizọs, ma ihe mere m ji jụwazie gị ya bụ ihe ahụ onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ kwuru. Echeghị m na mụ na gị ekwutụla gbasara ya.

Anthony: Ị̀ ga-achọ ka m gosi gị amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl gosiri na mmadụ inwe okwukwe na Jizọs dị ezigbo mkpa? Ndịàmà Jehova na-agụrụ ha ndị mmadụ ma ha ziwe ha ozi ọma.

Tim: Ngwanụ.

Anthony: Ebe mbụ anyị ga-agụ bụ ihe Jizọs kwuru na Jọn 14:6. O kwuru ya mgbe ya na otu n’ime ndịozi ya na-akparịta ụka. Ebe ahụ sịrị: “Jizọs wee sị ya: ‘Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.’” Ònye ka amaokwu a kwuru na anyị ga-esi n’aka ya bịakwute Chineke?

Tim: Ọọ Jizọs.

Anthony: Gbam! Ọọ ihe Ndịàmà Jehova kweere. Ka m jụgodị gị otu ajụjụ: N’ihe ị ma gbasara Chineke, olee onye anyị kwesịrị ikpe ekpere n’aha ya?

Tim: Ọọ Jizọs.

Anthony: I kwutere ya. Ọọ ya mere m ji ekpe ekpere niile m na-ekpe n’aha Jizọs. Ọọ kwa ihe Ndịàmà Jehova niile na-eme.

Tim: Ọ dị mma na ị gwara m.

Anthony: Amaokwu ọzọ anyị ga-eleba anya bụ Jọn 3:16. Amaokwu a dị ezigbo mkpa nke na ọ bụrụ na a sị ka e si na Baịbụl wepụta otu amaokwu gosiri ihe Jizọs bịara mee n’ụwa, ọ bụ amaokwu a ka a ga-ewepụta. Biko, gụọ ya.

Tim: Ngwanụ. Ọ sịrị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

 Anthony: I meela. Ị̀ nụtụla ihe a amaokwu a kwuru?

Tim: Ee. M nụla ya ọtụtụ ugboro na chọọchị anyị.

Anthony: Ọtụtụ ndị ma ihe amaokwu a kwuru. I leruo ya anya, ị ga-ahụ na Jizọs sịrị na Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ndụ ebighị ebi maka na ọ hụrụ ha n’anya. Ma, olee ihe o kwuru anyị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi?

Tim: Ọ sịrị na anyị ga-enwe okwukwe.

Anthony: Ihe i kwuru bụ eziokwu. Anyị ga-enwe okwukwe na Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. N’Ụlọ Nche a m wetaara gị, ị ga-ahụ na e kwuru na peeji ya nke abụọ na ihe ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi bụ inwe okwukwe na Jizọs. E kwuru na otu n’ime ihe ndị mere e ji ebipụta Ụlọ Nche bụ na “ọ na-agwa ndị mmadụ ka ha nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, bụ́ onye nwụrụ ka anyị wee nweta ndụ ebighị ebi, onye bụ́kwa Eze na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke.”

Tim: Nke bụ́ na akwụkwọ unu kwudịrị na unu kweere na Jizọs?

Anthony: Ee.

Tim: Gịnịzi mere ndị mmadụ ji ekwu na unu ekweghị na Jizọs?

Anthony: Ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ihe mere ha ji ekwu ya. Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu ya maka na ha nụrụ mgbe ndị ọzọ kwuru ya, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ pastọ ha ma ọ bụ ụkọchukwu ha gwara ha ya.

Tim: Ihe gbatara m n’uche ugbu a bụ na ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu ya maka na unu na-aza Ndịàmà Jehova kama ịza Ndịàmà Jizọs.

Anthony: O nwere ike iso n’ihe mere ha ji ekwu ya.

Tim: Ma, gịnị mere unu ji ekwukarị banyere Jehova?

‘EMEWO M KA HA MARA AHA GỊ’

Anthony: Otu ihe kpatara ya bụ na anyị kweere na ọ dị mkpa ka anyị na-akpọ Chineke aha ya otú Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, mere. Lee ihe Jizọs gwara Chineke n’ekpere. E dere ya na Jọn 17:26. Biko, gụọ ebe ahụ.

Tim: Oo. Ọ sịrị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”

Anthony: I meela. Ị̀ hụrụ na Jizọs sịrị na ya mere ka a mara aha Chineke. Olee ihe i chere mere o ji mee otú ahụ?

Tim: Eeem, amaghị m.

Mmadụ ga-enwerịrị okwukwe na Jizọs tupu a zọpụta ya

Anthony: Ka anyị gụọ ebe ọzọ ga-eme ka ihe a anyị na-ekwu dokwuo gị anya. Ebe m bu n’obi bụ Joel 2:32. Mbido ya sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.” Ama m na i kwetara na ọ bụrụ na ịkpọ aha Jehova ga-eme ka mmadụ lanahụ mbibi ma ọ bụ ka a zọpụta onye ahụ, Jizọs ga-amarịrị gbasara ya?

Tim: Ee.

Anthony: Ihe ọ pụtara bụ na otu ihe mere Jizọs ji chọọ ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Chineke ma na-akpọ ya aha ahụ bụ ka a zọpụta ha. O sokwa n’ihe ndị mere anyị ji ekwukarị gbasara Jehova. Anyị ma na ọ dị mkpa ka anyị mee ka ndị mmadụ mara aha Chineke, anyị chọkwara inyere ha aka ka ha na-akpọ aha ahụ.

Tim: Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ amaghị aha Chineke ma ọ bụkwanụ na ha anaghị akpọ ya aha ya, mgbe ọ bụla e kwuru banyere Chineke, ha na-ama onye a na-ekwu.

Anthony: Ha nwere ike ịma onye a na-ekwu. Ma, ihe mere Chineke ji gwa anyị aha ya bụ na ọ chọrọ ka ọ dịrị anyị mfe ịkpa ya nso.

Tim: Aghọtachaghị m ihe ị na-ekwu.

Anthony: Ka m meere gị otu ihe atụ. Ò nwere ihe gaara emebi ma ọ bụrụ na anyị amaghị aha Mozis?

Tim: Mba, o nweghị.

Anthony: Naanị ihe anyị gaara ama bụ na  e nwere otu nwoke mere ka Osimiri Uhie kewaa ma ọ bụ na e nwere otu nwoke e nyere Iwu Iri ahụ. Anyị agakwaraghị ama aha Noa. Naanị ihe anyị ga-anụ bụ na e nwere otu nwoke wuru ụgbọ e ji zọpụta ya na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ. Ihe ọ pụtakwara bụ na ihe anyị gaara ama gbasara Jizọs Kraịst bụ na e nwere onye si n’eluigwe bịa nwụọ n’ihi mmehie anyị. Ọ́ bụghị ya?

Tim: Ọọ ya.

Anthony: Ma Chineke mere ka anyị mara aha ha. Aha ha anyị ma mere ka o dokwuo anyị anya na ihe ndị Baịbụl kọrọ gbasara ha mere eme. Ọ bụ eziokwu na anyị ahụtụbeghị Mozis, Noa, na Jizọs, ma aha ha anyị ma mere ka anyị ghọtakwuo na ha dịrị ndụ n’eziokwu.

Tim: Ihe a i kwuru bụ eziokwu, ma ọ gbatatụbeghị m n’obi.

Anthony: O so n’ihe mere Ndịàmà Jehova ji akpọkarị Chineke aha ya. Anyị chọrọ ka ndị mmadụ nwee okwukwe na Jehova Chineke dị adị nakwa na ha na ya nwere ike ịdị ná mma. Ma, anyị ejighị Jizọs egwu egwu. Anyị na-eme ka ndị mmadụ mara ọrụ Jizọs rụrụ nke mere a ga-eji zọpụta anyị. Ị̀ ga-achọ ka anyị gụọ otu ebe ọzọ ga-eme ka ị ghọta ihe m na-ekwu?

Tim: Nsogbu adịghị.

Anthony: Anyị agụbuola Jọn 14:6. Ị ga-echeta na Jizọs kwuru n’ebe ahụ na ya bụ “ụzọ na eziokwu na ndụ.” Ka anyị gụzie ihe Jizọs kwuru na Jọn 14:1. Biko, gụọ ihe o kwuru ná ngwụcha amaokwu ahụ.

Tim: Ọ dị mma. Ọ sịrị: “Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.”

Anthony: I meela. Ị̀ ga-asị ugbu a na ọ bụrụ na mmadụ nwere okwukwe naanị na Jizọs ma ọ bụ naanị na Jehova, na onye ahụ nwere ezigbo okwukwe?

Tim: Mba. Jizọs sịrị na anyị ga-enwe okwukwe na Chineke, nweekwa na yanwa.

Anthony: Ọọ eziokwu. Ama m na ị ga-ekweta na mmadụ ikwu n’ọnụ na ya nwere okwukwe na Chineke nakwa na Jizọs abụghị ebe okwu biri. Àgwà anyị kwesịrị igosi na anyị nwere okwukwe.

Tim: Ọọ ya.

Anthony: Ma, olee otú mmadụ ga-esi egosi na ya nwere okwukwe na Chineke nakwa na Jizọs? M ga-achọ ka anyị leba ajụjụ a anya ma m bịa ụbọchị ọzọ. *

Tim: Ọ dị mma otú ahụ.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-edoghị gị anya? Ka è nwere ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ma ọ bụ ihe ha na-eme nke ị na-aghọtaghị? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ. Obi ga-atọ Onyeàmà Jehova ahụ ụtọ ka gị na ya kpaa ya.

^ para. 62 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ isi nke 12 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.