ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?
Ànyị Kwesịrị Ịtụ Setan Egwu?
E nwere ikuku ọjọọ a na-akpọ kabọn monọzaịd. Ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịmata ebe ikuku a dị n’ihi na a naghị ahụ ya anya, ọ naghịkwa esi ísì, mmadụ nwekwara ike ikuru ya n’amaghị ama. O nwere ike ịbụ na e kee ndị niile ikuku ọjọọ na-egbu n’ụwa ụzọ abụọ, ọ bụ ikuku a na-egbu ihe karịrị otu ụzọ. Ma, nke a ekwesịghị ime ka obi koro anyị n’elu n’ihi na e nwere otú mmadụ nwere ike isi mata ebe ikuku ọjọọ ahụ dị. E nwekwara ihe ị ga-eme ka ọ ghara imerụ gị ahụ́. Ọtụtụ ndị nwere ihe na-eme ka ha mata ebe ikuku ahụ dị. Ha mata, ha emezie ihe ha kwesịrị ime ka ọ ghara imerụ ha ahụ́.
Setan dị ka ikuku ọjọọ ahụ. Ndị mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya n’ihi na ọ bụ mmụọ, ọ bụkwa onye ọjọọ. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ Setan egwu n’ihi na Chineke na-enyere anyị aka. Chineke nyere gị ihe ndị na-esonụ ga-eme ka Setan ghara imeri gị.
Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Jems 4:7 gwara anyị, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” Ọ bụ eziokwu na Setan dị ike, ma ọ gaghị amanyeli gị ka i mee ihe ị na-achọghị ime. Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Pita nke Mbụ 5:9 sịrị: ‘Guzogidenụ Ekwensu, sienụ ike n’okwukwe.’ Cheta na Setan hapụrụ Jizọs mgbe ọ na-achịtaghị ájá n’ọnwụnwa atọ ọ nwara Jizọs. (Matiu 4:11) Gịnwa nwekwara ike ikpebi na Setan agaghị anwata gị.
I nwere ike ịbụ enyi Chineke. Jems 4:8 gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso.” Jehova chọrọ ka ị bụrụ ezigbo enyi ya. Ma, olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ enyi ya? Otú kacha mma ị ga-esi amalite bụ isi na Baịbụl mụtakwuo banyere Jehova. (Jọn 17:3) Ihe ndị ị na-amụta banyere Jehova ga-eme ka ị hụ ya n’anya, ọ bụrụ na ị hụ ya n’anya, ị ga na-eme ihe ọ chọrọ. (1 Jọn 5:3) Mgbe ị na-agbalị ka ị bụrụ enyi Nna gị nke eluigwe, olee ihe ọ ga-eme? Jems kwuziri na ‘Chineke ga-abịarukwa gị nso.’
Chineke kwuru na ọ ga-echebe gị. Ilu 18:10 sịrị: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.” Ihe a Baịbụl kwuru apụtaghị na aha Chineke bụ ọtụmọkpọ. Kama ọ pụtara na ndị ji obi ha niile na-akwanyere aha Chineke ùgwù nwere ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o chebe ha.
Ihe Ndị Kraịst mere ga-enyere gị aka. Ọrụ Ndịozi 19:19 gwara anyị ihe ndị bi n’Efesọs mere mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “N’ezie, ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile. Ha wee gbakọọ ọnụ ahịa ha wee hụ na o ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise.” * Ndị Kraịst ahụ mebisịrị ihe niile ha ji eme mgbaasị n’agbanyeghị ego ole a na-ere ha. Ihe a ha mere nwere ike ịbara anyị ezigbo uru taa. Ndị na-eme anwansi na mgbaasị jụrụ ebe niile n’ụwa anyị a. O nwere ike ịdị mmadụ ka o nwechaghị ihe dị njọ n’ime mgbaasị ma ọ bụ na ihe ndị e ji eme mgbaasị adịchaghị njọ. Ma, ha nwere ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ kpatara gị nsogbu. N’ihi ya, i kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka i zere ime mgbaasị na ihe ọ bụla e ji eme ya.—Diuterọnọmi 18:10-12.
Rogelio, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ gbara n’Ụlọ Nche a, ekwetaghị na Ekwensu dị adị ruo mgbe ọ karịrị afọ iri ise. Ma, o mechara gbanwee echiche ya. Gịnị mere o ji gbanwee ya? Rogelio kwuru, sị: “M nwetara Baịbụl, bụ́ ihe m na-emetụbeghị ná ndụ m. Ihe m mụtara na ya mere ka o doo m anya na Ekwensu dị adị. Ihe ahụ m mụtara na-enyere m aka ugbu a ka Ekwensu ghara ịnwata m.”
‘Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka o doo m anya na Ekwensu dị adị. Ihe ahụ m mụtara na-enyere m aka ugbu a ka Ekwensu ghara ịnwata m’
Ị̀ ga-achọ ịnọ ndụ mgbe Setan na-agaghịzi adị? I nwere ike ịnọ ndụ mgbe ahụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe ga-emecha mee Ekwensu, bụ́ onye na-eduhie ọtụtụ ndị mmadụ. Ọ sịrị na a ga-atụba Ekwensu “n’ime ọdọ ọkụ na sọlfọ.” (Mkpughe 20:10) N’eziokwu, o nweghị ihe ọkụ na sọlfọ nkịtị ga-emeli mmụọ a na-anaghị ahụ anya. Nke a gosiri na ọdọ ọkụ ahụ pụtara mbibi ebighị ebi. A ga-ebibi Setan, ya anwụọ pịị. Ndị niile hụrụ Chineke n’anya ga-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, na-agbalị ike gị niile ka ị na-amụtakwu banyere Jehova na iwu ya. * Chegodị otú obi ga-adị gị ịnọ ndụ mgbe a ga-asị n’eziokwu na “Setan adịghị.”
^ para. 8 Ọ bụrụ na mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ ego ndị Rom a na-akpọ dinarịọs, ọ pụtara na ego ahụ bụ ego ole a ga-akwụ puku ndị ọrụ iri ise n’ụbọchị. Ọ bụghị obere ego.
^ para. 11 Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere Setan na ime mgbaasị, gụọ isi nke 10 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka o nye gị ya ma ọ bụ gị agụọ ya na www.mr1310.com/ig.