ṄOMIE OKWUKWE HA | JOSEF
“Ọ́ Bụghị Chineke Nwe Ịkọwa Ihe?”
WERE ya na ị na-ahụ Josef ka ọ na-aga na kọrịdọ ụlọ mkpọrọ n’Ijipt, ọsụsọ ana-agba ya maka ọrụ ọ rụrụ. Oké anwụ na-acha n’èzí mere ka ime ụlọ mkpọrọ ahụ dị ka ebe a kwanyere ọkụ. Ebe a ka o jizi mere ụlọ ya. Ndị mkpọrọ niile nọ ebe a na-akwanyere ya ùgwù. Ma, yanwa bụkwa onye mkpọrọ.
Ọ ga-abụrịrị na ọ na-echetakarị mgbe ọ na-elekọta ìgwè atụrụ nna ya n’ugwu Hibrọn. Ọ dị afọ iri na asaa mgbe Jekọb nna ya dunyere ya ozi ebe were ya ọtụtụ kilomita iji ruo. Ma ugbu a ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o nweereghịzi onwe ya otú ahụ o nweere onwe ya mgbe ahụ. Ụmụnne Josef nweere ya anyaụfụ, chọwa otú ha ga-esi gbufuo ya, ma mechaa ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. Ndị zụrụ ya kpọọrọ ya laa Ijipt. O bidokwara jewe ozi n’ụlọ Pọtịfa, onyeisi ndị nche eze Ijipt. Pọtịfa tụkwasịrị Josef obi. Ma, ihe mere otu ụbọchị mere ka ọ kwụsị ịtụkwasị ya obi. Nwunye Pọtịfa boro Josef ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. Ọ bụ ebubo a mere e ji tụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. *—Jenesis, isi nke 37, na nke 39.
Josef dịzi afọ iri abụọ na asatọ ugbu a, o meekwala ihe dị ka afọ iri ọ gbara ohu, nọọkwa n’ụlọ mkpọrọ. O nweghị mgbe o chere na ụwa ga-adị ya otú a ọ dị ya. Ọ̀ ga-emecha si n’ụlọ mkpọrọ a pụta? Ọ̀ ga-emecha hụ papa ya karala nká ọzọ ma ọ bụ hụ Benjamin nwanne ya nta ọzọ? Afọ ole ka ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ a?
Ò nwetụla mgbe ụwa dị gị otú a ọ dị Josef? Mgbe anyị dị obere, anyị na-atụ anya na ihe ga-agara anyị siriri werere. Ma, ọ naghị adịcha otú ahụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka nsogbu bịaara anyị agaghị ala ala ma ọ bụ na anyị agaghị edili ya. Ma, ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Josef.
“JEHOVA NỌNYEERE JOSEF”
Josef ma na Chineke ya, bụ́ Jehova, na-ahụ ihe na-emenụ. Nke a mere ka obi sie ya ike. Jehova gọziri Josef n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’obodo ọzọ. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọnyeere Josef wee na-egosi ya obiọma ma mee ka ihe ya na-amasị onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ.” (Jenesis 39:21-23) Josef nọ na-arụsi ọrụ ike, na-eme ihe na-amasị Jehova, Jehova ana-agọzikwa ya. Ọ ga-abụrịrị na ọmụma ọ ma na Jehova nọnyeere ya kasiri ya obi.
Jehova ò bu n’obi ka Josef nwụọ n’ụlọ mkpọrọ? A jụọ Josef ihe a, o nwere ike ọ gaghị ama ihe ọ ga-aza. Ma, ọ kwụsịghị ịna-arịọ Chineke ka o nyere ya aka. Chineke zara ya ekpere ya n’ụzọ ọ na-atụghị anya ya. Otu ụbọchị, ihe a na-atụghị anya ya mere. A kpọbatara mmadụ abụọ na-ejere Fero ozi n’ụlọ mkpọrọ ahụ Josef nọ. Otu bụ onyeisi ndị na-emere Fero achịcha, onye nke abụọ abụrụ onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ Fero.—Jenesis 40:1-3.
Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ nyere Josef ikike ka ọ na-elekọta mmadụ abụọ ahụ a kpọbatara * N’otu abalị, ha abụọ rọrọ nrọ gbara ha gharịị. Mgbe chi bọrọ, Josef chọpụtara na obi adịghị ha mma n’ihi na ihu ha gbarụrụ agbarụ. Josef jụrụ ha, sị: “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?” (Jenesis 40:3-7) O nwere ike ịbụ na otú o si medaa obi jụọ ha ya mere ka obi ruo ha ala ịkọrọ ya ihe na-enye ha nsogbu n’obi. Josef amaghị na ihe ya na ndị ahụ na-aga ịkparịta ga-agbanwe nnukwute ihe ná ndụ ya. Ma, ha agaaraghị akparịtawa ụka ma á sị na Josef emedaghị obi jụọ ha ihe ha na ya na-alụ. Ihe a o mere kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị, sị, ‘Ọ bụrụgodị na m nọ ná nsogbu, m̀ ka tụkwasịrị Chineke obi ma na-egosi ndị ọzọ na ihe banyere ha na-emetụ m n’obi?’
ọhụrụ.Ụmụ nwoke abụọ ahụ gwara Josef na nrọ ha rọrọ na-atụ ha ụjọ n’ihi na ọ gbara ha gharịị, o nweghịkwa onye ha hụrụ ga-akọwara ha ya. Ndị Ijipt ejighị nrọ egwu egwu, ha na-agakwurukwa ndị sị na ha na-akọwa nrọ ka ha kọwaara ha nrọ ha. Ụmụ nwoke abụọ ahụ amaghị na ọ bụ Jehova Chineke Josef mere ka ha rọọ nrọ ahụ. Ma, Josef ma. Ọ gwara ha, sị: “Ọ́ bụghị Chineke nwe ịkọwa ihe? Biko, kọọrọnụ m [nrọ unu].” (Jenesis 40:8) Ndị niile ji obi ha dum amụ Baịbụl taa ma na ihe a Josef kwuru bụ eziokwu. Ọ ga-amagbu onwe ya ma ndị niile sị na ha na-efe Chineke dị umeala n’obi ka Josef. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịghọta okwu ya, anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị ga-aghọtali okwu Chineke n’onwe anyị.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13; Jems 4:6.
Onye nke mbụ kọọrọ Josef nrọ ya bụ onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ. Ọ gwara Josef na ọ hụrụ osisi vaịn nwere alaka atọ, alaka ndị ahụ abịa mịa ụyọkọ mkpụrụ vaịn, mkpụrụ ndị ahụ achaakwa, ya aghọrọ ha pịnye n’iko mmanya Fero. Jehova mere ka Josef ghọta ihe nrọ ahụ pụtara ozugbo. Josef gwara obu ihe ọṅụṅụ ahụ na alaka atọ ahụ pụtara ụbọchị atọ. Ọ gwakwara ya na n’ime abalị atọ, Fero ga-akpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ ma kpọghachi ya n’ọrụ ya. Ihu obu ihe ọṅụṅụ ahụ gbasapụrụ ozugbo ahụ. Josef rịọziri ya, sị: “Biko, gosikwa m obiọma ma kọọrọ Fero banyere m.” Josef kọkwaara ya na e si n’ala Hibru tọrọ ya nakwa na o nweghị ihe ọ bụla o mere e ji tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.—Jenesis 40:9-15.
Mgbe onyeisi ndị na-emere Fero achịcha hụrụ na ihe a kọwaara onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ dị mma, ọ kọọrọ Josef nrọ nke ya. Ọ gwara ya na ya bu nkata atọ achịcha dị n’ime ha, nakwa na anụ ufe nọ na-eri achịcha dị n’otu n’ime nkata ndị ahụ. Mgbe ọ kọchara, Jehova mekwara ka Josef mata ihe nrọ a pụtara. Ma, ihe nrọ a pụtara agaghị eme onye a na-eme achịcha obi ụtọ. Josef gwara ya, sị: “Nke a bụ nkọwa ya: Nkata atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. Abalị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị ma gbupụ gị Jenesis 40:16-19) Josef mere ka ndị ibe ya fere Chineke. Ọ katara obi gwa ndị mmadụ ihe Chineke kwuru, ma hà bụ ihe ọma ga-emere ha ma hà bụ ikpe a ga-ama ha.—Aịzaya 61:2.
isi, ọ ga-akwụwa gị n’osisi; anụ ufe ga-erikwa anụ gị.” (Abalị atọ Josef kọwachara nrọ a, ihe o kwuru mezuru. Fero mere ememme ndị fere Chineke n’oge ochie na-emeghị, ya bụ, ememme ncheta ọmụmụ ya. Ọ nọkwa n’ememme ahụ kwuo ihe a ga-eme ndị ahụ na-ejere ya ozi nọ n’ụlọ mkpọrọ. E gburu onyeisi ndị na-emere Fero achịcha, kpọghachikwa onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ Fero n’ọrụ ọ na-arụbu, otú ahụ Josef kwuru. Ma, obu ihe ọṅụṅụ ahụ chefuru Josef.—Jenesis 40:20-23.
“Ọ BỤGHỊ M KA Ọ DỊ N’AKA!”
Afọ abụọ ihe a mechara, Josef ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ. (Jenesis 41:1) Chegodị otú obi ga-adị ya. Ọ ga-abụ na ozugbo Jehova mere ka ọ kọwaara ụmụ nwoke abụọ ahụ nrọ ha, ọ bịara na-atụsi anya ike na o ruwela mgbe Jehova ga-eme ka o si n’ụlọ mkpọrọ pụta. O nwere ike ịbụ na ụbọchị ọ bụla chi foro, Josef echee na ọ bụ ụbọchị a ga-atọhapụ ya. Ma, e mechaakwa, ya abụrụ na nkịtị nkịtị. Ọ ga-abụ na afọ abụọ ahụ bụ afọ ndị kacha siere ya ike ná ndụ. Ma, o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịtụkwasị Jehova Chineke ya obi. O kweghị ka ihe mere ya mee ka obi daa ya mbà, ọ nọgidekwara na-atachi obi. N’ikpeazụ, nsogbu ndị ahụ medịrị ka okwukwe ya sikwuo ike.—Jems 1:4.
N’ụwa a nsogbu juru na ya, ò nwere onye n’ime anyị na-ekwesịghị ịgbalị na-enwekwu ndidi? Ihe ga-enyere anyị aka ịna-edi nsogbu ndị na-abịara anyị taa bụ ịna-arịọ Chineke ka o mee ka anyị na-akata obi, ka anyị na-enwe ndidi, nakwa ka obi na-eru anyị ala. Jehova mere ka obi sie Josef ike nakwa ka o nwee nchekwube. Ọ ga-emekwara anyị otú ahụ.—Ndị Rom 12:12; 15:13.
Ọ bụrụgodị na obu ihe ọṅụṅụ ahụ echefuola Josef, Jehova echefubeghị ya. N’otu abalị, Jehova mere ka Fero rọọ nrọ abụọ dị egwu. Ná nrọ nke mbụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị mara mma ma maakwa abụba ka ha si n’Osimiri Naịl na-apụta. Ọ hụkwara ehi asaa ndị jọrọ njọ ma taakwa ahụ́ ka ha sikwa n’osimiri ahụ na-apụta. Ndị nke tara ahụ́ riri ndị nke mara abụba. Ná nrọ nke abụọ, Fero hụrụ oko ọka asaa dị mma. Ọ hụkwara oko ọka asaa ọzọ fịkpọrọ afịkpọ, ndị ifufe mere ka ha kpọọ nkụ. Ndị nke a fịkpọrọ afịkpọ loro ndị nke ahụ dị mma. Mgbe Fero tetara n’ụtụtụ, obi ezughị ya ike maka nrọ a ọ rọrọ. N’ihi ya, ọ kpọrọ ndị amamihe ya niile na ndị niile na-eme anwansi n’Ijipt ka ha kọwaara ya nrọ ya. Ma, o nweghị onye n’ime ha kọwaliri ya. (Jenesis 41:1-8) Anyị amaghị ma ihe merenụ ọ̀ bụ na ha amaghị ihe ha ga-ekwu ka ọ̀ bụ na onye nke a kọrọ gaa n’aka nri, onye nke ọzọ akọrọ gaa n’aka ekpe. Ihe anyị ma bụ na ha menyere Fero ihere. Ma, Fero ka chọsiri ike ka a kọwaara ya nrọ ya.
Ọ bụ ugbu a ka obu ihe ọṅụṅụ ahụ chetara Josef. Obi ya bidoro mawa ya ikpe, ya agwazie Fero gbasara Josef, na ọ bụ ya kọwaara ya na onyeisi ndị na-eme achịcha nrọ ha rọrọ afọ abụọ gara aga mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Fero kwuru ka a kpọtara ya Josef ozugbo.—Jenesis 41:9-13.
Chegodị otú obi dị Josef mgbe ndị si n’obí eze bịara gwa ya na eze chọrọ ịhụ ya. Ọ gara gbanwee efe ya ozugbo, kpụọkwa afụ ọnụ ya. O nwekwara ike ịbụ na ọ kpụrụ isi ya ya ana-akwọ mụrụmụrụ n’ihi na ọ bụ otú ndị Ijipt si eme. Ọ ga-abụrịrị na ọ rịọsiri Jehova ike ka o nyere ya aka ka ọ mara ihe ọ ga-ekwu n’ihu eze. Obere oge, a kpọbatara ya n’ọmarịcha obí eze, ya eguzoro n’ihu nnukwu eze a a na-efe ka chi. Baịbụl kwuru, sị: “Fero wee sị Josef: ‘arọrọ m nrọ, ma ọ dịghị onye pụrụ ịkọwa ya. Ugbu a, anụwo m ka e kwuru banyere gị na ị pụrụ ịnụ nrọ ma kọwaa ya.’” Ihe Josef gwara ya gosiri ọzọ na Josef dị umeala n’obi nakwa na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ọ gwara ya, sị: “Ọ bụghị m ka ọ dị n’aka! Chineke ga-agwa Fero ihe ga-abụ maka ọdịmma ya.”—Jenesis 41:14-16.
Jehova hụrụ ndị dị umeala n’obi na ndị tụkwasịrị ya obi n’anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka Josef nwee ike ịkọwa nrọ ahụ ndị amamihe na ndị anwansi Ijipt na-enweghị ike ịkọwa. Josef gwara Fero na nrọ abụọ ahụ ọ rọrọ pụtara otu ihe. Ọ gwakwara ya na ihe mere Jehova ji mee ka ọ rọọ ya ugboro abụọ bụ iji mee ka ọ mara na e meela ka nrọ ahụ “guzosie ike,” ya bụ, na ihe nrọ ahụ pụtara ga-emerịrị. Josef gwara ya na ehi asaa ahụ Jenesis 41:25-32.
mara abụba na oko ọka asaa ahụ mara mma pụtara afọ asaa a ga-enwe ihe oriri n’ụba n’ala Ijipt, ebe ehi asaa ahụ tara ahụ́ na oko ọka asaa ahụ fịkpọrọ afịkpọ pụtara afọ asaa a ga-enwe ụnwụ. Ụnwụ ahụ ga-akpa ala Ijipt aka ọjọọ ozugbo afọ asaa ahụ a ga-enwe nri n’ụba gachara.—Fero ma na Josef kọwatara nrọ ahụ. Ma, Fero amaghị ihe ọ ga-eme eme. Josef tụụrụ ya aro ihe ọ ga-eme. Ọ gwara ya ka ọ chọta nwoke “nwere uche, nke makwaara ihe” ka ọ na-ahụ maka ịchịkọta ihe oriri n’afọ asaa ahụ a ga-enwe nri n’ụba. O ruzie n’oge ụnwụ, e wepụtawa ihe oriri ndị ahụ na-enye ndị mmadụ ka ha ghara ịnwụ. (Jenesis 41:33-36) A naghị ajụ ajụ ma Josef ò ruru eru ka e nye ya ọrụ ahụ. Ma, Josef agwaghị Fero ka ọ họpụta ya. Ụdị ihe ahụ abatatụdịghị Josef n’obi n’ihi na ọ dị umeala n’obi, tụkwasịkwa Jehova obi. Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Chineke obi, anyị agaghị achọwa ọkwá ukwu. Obi ga-erukwa anyị ala n’ihi na anyị hapụrụ ihe niile n’aka Jehova.
“È NWERE IKE ỊCHỌTA NWOKE ỌZỌ NKE DỊ KA ONYE A?”
Fero na ndị niile na-ejere ya ozi chọpụtara na aro ahụ Josef tụrụ amaka. Fero kwukwara ihe gosiri na ọ ma na ọ bụ Chineke Josef mere ka o nwee ike ịkọwa nrọ ahụ. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi nọ n’obí ya, sị: “È nwere ike ịchọta nwoke ọzọ nke dị ka onye a mmụọ Chineke dị n’ime ya?” Ọ gwaziri Josef, sị: “Ebe ọ bụ na Chineke emewo ka ị mara ihe a dum, ọ dịghị onye nwere uche, nke makwaara ihe dị ka gị. Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọ m, ndị m niile ga na-erubekwara gị isi n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ naanị ocheeze ka m ga-eji ka gị ukwuu.”—Jenesis 41:38-41.
Fero mere ihe niile ahụ o kwuru. E yiwere Josef ákwà linin ọma. Fero nyekwara Josef ihe olu ọlaedo, mgbaaka e ji aka ihe akara, na ụgbọ ịnyịnya ka o jiri gbagharịa n’ala Ijipt dum ma hazie maka ịchịkọta ihe oriri ahụ. (Jenesis 41:42-44) Ọ bụ otú ahụ ka Josef si si n’ịbụ onye mkpọrọ ghọọ osote eze Ijipt n’otu ụbọchị. Ihe a Jehova meere Josef gosiri na o nweghị ihe dị ka mmadụ ịtụkwasị Jehova obi. Jehova ma otú e sirila megbuo Josef kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, o mere ka mmegbu niile ahụ kwụsị mgbe kwesịrị ekwesị nakwa n’otú kacha mma. Ihe Jehova mere abụghị naanị ime ka a kwụsị imegbu Josef, kama, o sikwa otú ahụ chebe mba Izrel. N’isiokwu ndị ọzọ anyị ga-ebipụta gbasara Josef, anyị ga-ahụ otú Jehova si chebe mba Izrel.
Ọ bụrụ na o nwere nsogbu gị na ya na-alụ, ma ọ bụkwanụ na a na-emegbu gị kemgbe, adala mbà. Cheta akụkọ Josef. Jehova gọziri Josef n’ihi na Josef akwụsịghị imere ndị ọzọ ihe ọma, ịdị umeala n’obi, ịtụkwasị Chineke obi, na ịtachi obi.
^ para. 4 Ị chọọ ịmatakwu gbasara Josef na ebubo ahụ e boro ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2014 na nke Nọvemba 1, 2014.
^ para. 10 Ndị Ijipt oge ochie na-eri ihe karịrị ụdị achịcha iri itoolu. Nke a gosiri na onyeisi ndị na-emere Fero achịcha abụghị obere mmadụ. Onyeisi ndị na-ebu ihe ọṅụṅụ abụghịkwa obere mmadụ n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ndị na-ahụ na mmanya Fero na-aṅụ bụ ịgba nakwa na e tinyeghị ya nsí. Onye ọ bụla bụ́ onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ na-abụkarịkwa onye ndụmọdụ eze a tụkwasịrị obi.