Ncheta Ọnwụ Jizọs
Satọdee, Eprel 12, 2025
Otu ugboro n’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-echeta ọnwụ Jizọs otú ahụ o nyere anyị iwu ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”—Luk 22:19.
Anyị na-akpọ gị ka ị bịa nnọkọ a.
Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Anyị Banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs
Awa ole ka ọ ga-ewe?
Ọ ga-ewe ihe dị ka otu awa.
Ebee ka a ga-eme ya?
Jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè unu ka ha gwa gị.
M̀ ga-akwụ ụgwọ tupu e kwe ka m bata?
Mba.
À ga-ana ndị bịara nnọkọ ahụ ego?
Mba.
Olee ụdị uwe m kwesịrị iyi?
E nweghị ụdị uwe pụrụ iche a na-eyi abịa nnọkọ a. Ma, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ iso ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara iji ejiji dị mma ma dị ọgọ. (1 Timoti 2:9) Ọ dịghị mkpa ka i yiri uwe dị oké ọnụ ma ọ bụ nke dị oké mma.
Gịnị ka a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs?
A na-eji abụ na ekpere ebido, jirikwa abụ na ekpere mechie. Onyeàmà Jehova na-ekpe ekpere nke ọ bụla. Ihe bụ́ isi a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ikwu okwu ga-akọwa uru ọnwụ Jizọs bara na otú anyị ga-esi rite uru n’ihe a Chineke na Jizọs meere anyị.
Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?” ka ị matakwuo gbasara nnọkọ a?”
Olee mgbe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ ndị na-abịa abịa?
2025: Satọdee, Eprel 12
2026: Tọzdee, Eprel 2